Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nye Chineke Ọnọdụ MbụIhe Atụ

Nye Chineke Ọnọdụ Mbụ

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

“Chineke Enyela Gị Ọnọdụ Mbụ n’Ime Obi Ya”

Gịnị ka ị ga-eche ma ọ bụrụ na mmadụ gwa gị na Chineke na-ahụ gị dika à ga-asị na i mebeghị mmehie? Nke bụ́ eziokwu bụ na, n’ihi ọrụ mgbapụta Jizọs rụrụ n’obe, otú ahụ ka Chineke si ahụ gị. Dị ka Ndị Kraịst, agbagharala,sachaa, ma tọhapụ anyị!

Nke ahụ pụtara na ị bụ onye-nsọ: onye nwetaworo nguzo pụrụ iche nke ezi omume n’ime Kraịst. Ị bụ onye zuru okè, dị nsọ ma zuo okè n'anya Chineke. Ọ na-akpọ gị nwa Ya, onye nketa nke akụ n’ụbara Ya, na enyi Ya.

“Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:” 1 Pita 2:9

N'ezie ịghọta otú Chineke si ahụ anyị na-amalite site n'otú anyị si ahụ Ya. Chineke adịghị ele anyị anya site n'ebe dị anya naanị ka Ọ hụta mehie anyị we nwe ihe iji taa anyị ahụhụ. Ọ dịghị ihe pụrụ ịdị anya site n'eziokwu ahụ.

Tụlee ihe amaokwu a na-ekwu:

“Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n'aha-Ya: ndi amuru, ọ bughi site n'ọbara, ọ bughi kwa site n'ọchichọ anu-aru, ọ bughi kwa site n'ọchichọ nwoke, kama site na Chineke.” Jọn 1:12-13

Chineke na-ahụ onye ọ bụla n'ime anyị ka Ya nke dị oke ọnụ ahịa. Ọ bụ Nna na-ahụ n'anya nke na-egosi anyị amara na ilekọta anyị n'ihi ọmịiko ya na-adịghị agwụ agwụ. Ụfọdụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’Abụ nke Abu na-egosi otú ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ si dika ịhụnanya nke di na nwunye. Ndị Hibru 11:6 na-agwa anyị na Chineke bụ Onye nēnyeghachi ndi nāchọ Ya ugwọ-ọlu.”

Chineke na-ahụ onye ọ bụla n’ime ụmụ Ya n’ụzọ dị nnọọ iche karịa ka ọtụtụ n’ime anyị si ahụta onwe anyị. Ịghọta otú Chineke si ahụ onye ọ bụla n’ime anyị dabere n’ọrụ ahụ Kraịst malitere na ndụ anyị ozugbo anyị nwetara nzọpụta.

“Ya mere ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekère ọhu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu.” II Ndi Kọrint 5:17

“Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.” II Ndi Kọrint 5:17

Ihe a e kere ọhụrụ bụ ọrụ Chineke; mgbanwe zuru oke nke ọnọdụ ime mmụọ anyị na mmadụ dị n'ime. Ọ gbagharala anyị kpamkpam ma sachapụ anyị pụọ na mmehie anyị – n'oge gara aga, ugbu a na n'ọdịnihu. Anyị na Ya nwere mmekọrịta ziri ezi.

“Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie (nmehie) nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.' Abu Ọma 103:12

Anyị bụ ndị nke Chineke echere n’ihu Ya n’enweghị ntụpọ ọ bụla nke mmehie; n’ezie dị ka ezi omume Ya site n’ọrụ ahụ Jizọs rụrụ n’elu obe. N'ezie, Chineke enyela anyị ọnọdụ mbụ n'ime obi Ya!

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nye Chineke Ọnọdụ Mbụ

Inye Chineke ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị abụghị ihe omume otu mgbe . . . ọ bụ usoro nke ogologo ndụ nke Onye Kraịst ọ bụla. Ma ị bụ onye ọhụrụ n’okwukwe ma ọ bụ onye “nara eso ụzọ Kraịst”, ị ga-ahụta atụmatụ a ka ọ dị mfe nghọta na itinye n’ọrụ, yana atụmatụ dị irè nke ukwuu maka ibi ndụ Ndị Kraịst na-emeri.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig