Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọnwụnwa: Echiche ỌhụrụIhe Atụ

Ọnwụnwa: Echiche Ọhụrụ

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Ọchịchọ Nwere Nsonaazụ

Ọchịchọ ndị a na-adịghị na nkwenye n'ebe Chineke nọ nwere nsonaazụ.

Mgbe anyị na-ekwe ka ọchịchọ anyị chịa anyị, ma na-adọtakwa anyị n'ime mmehie, ọ ga-emecha butere anyị ọnwụ. Ọnwụ a abụghị naanị nke anụ ahụ, kama ọ bụ nke ime mmụọ. Ọ bụ nkewapụ s'ite n'ebe Chineke nọ, ya na mbibi nke ihe niile dị mma ma makwa mma na ndụ anyị.

Okwu ahụ bụ "ọnwụ" n'amaokwu a bụ ihe ncheta maka ịdị oke njọ nke mmehie. Ọ bụghị naanị obere njehie. Ọ bụ nnupụisi megide Chineke, na ịjụ ịhụnanya ya na amara ya.

Ejila àgwà na-enweghị isi na-emeso ọchịchọ gị na mmehie.

Ihe ị na-akpọ, "obere" mmehie nwere ike iwepụ ihe niile dị oké ọnụ ahịa nye gị.

Cheta na ị ka nọ n'ụwa, ọbụlagodi mgbe Chineke gbaghaara gị, ọtụtụ mmadụ agaghị agbaghara gị, ọtụtụ mmadụ ga-ejide ya megide gị. Nke a nwere ike imebi ịdị adị gị n'ụwa.

Ọchịchọ na mmehie nwere Nsonaazụ!

Ekpere:

Nyere m aka ịhụ nsonaazụ mmehie otu ha dị. Nye m amamihe iji mata aghụghọ nke mmehie, na ike iji merie ya. Amen

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọnwụnwa: Echiche Ọhụrụ

Echiche Akwụkwọ Nsọ banyere Jems 1:12-16: Ịmara isi iyi nke ọnwụnwa na ịghọta usoro nke na-eduga ná mmehie, ga-enyere onye ọ bụla kwere ekwe aka ibi ndụ na-atọ Chineke ụtọ.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d