Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọnwụnwa: Echiche ỌhụrụIhe Atụ

Ọnwụnwa: Echiche Ọhụrụ

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Mmehie Anaghị Eme na Mberede

Na Jemis 1:14, Jemis na-ese onyinyo doro anya nke usoro ọnwụnwa na mmehie.

Ihe anyị na-akpọ mmehie na-amalite site n'ọchịchọ. Ọ dị ezigbo mkpa imesi isiokwu a ike na, Inwe ọchịchọ n'onwe ya abụghị ihe ọjọọ, nke a bụ ihe bụ nke mmadụ ọ bụla.

Ọchịchọ ndị a na-aghọ ihe ọjọọ mgbe a na-enyefeghị ha Chineke n'ihi na ọchịchọ a na-enyefeghị Chineke ga-ezipụ gị n'ebe Chineke nọ.

Okwu ahụ bụ́ "nrata" n'amaokwu a pụtara ịbụ onye a dọtara. Ọchịchọ anyị nwere ike ịrata anyị n'ime mmehie.

Lee otú Jemis si akọwa usoro nke na-eduga ná mmehie, Ọ na-ekwu na ọchịchọ na-adị ime ma mụọ mmehie. Mmehie, mgbe ọ etolitara, na-amụ ọnwụ.

Nke a kwesịrị ichetara onye kwere ekwe ọ bụla na, mmehie bụ usoro, ọ na-amalitekwa site na ọchịchọ anyị.

Otú a ga-esi meso ihe gbasara mmehie bụ ileru anya n'ebe ihe ndị bụ ọchịchọ gị, ma nyefee ha n'aka Chineke tupu ha atụrụ ime ma mụọ mmehie.

Ekpere:

Ana m ekele gị maka ncheta na mmehie na-eduga naanị n'ọnwụ. Ka m bie ndụ nke na-atọ gị ụtọ. Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọnwụnwa: Echiche Ọhụrụ

Echiche Akwụkwọ Nsọ banyere Jems 1:12-16: Ịmara isi iyi nke ọnwụnwa na ịghọta usoro nke na-eduga ná mmehie, ga-enyere onye ọ bụla kwere ekwe aka ibi ndụ na-atọ Chineke ụtọ.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d