Ọnwụnwa: Echiche ỌhụrụIhe Atụ
Ebe Ka Ọnwụnwa Si Abịa?
Kedụ ebe ọnwụnwa si bịa, n’ezie?
Ihe ọ bụla azịza gị bụ nye ajụjụ a dị n'elu ga-ekpebi ihe ga-abụ meghachi omume gị nye ọnwụnwa.
Azịza gị ga-ekpebikwa ihe ga-esi n'ọnwụnwa ọ bụla chere gi ihu pụta.
Mgbe ọnwụnwa na-eche anyị ihu, ihe mbụ ga-abịa n'obi anyị ga-abụ ịta Chineke ụta. Anyị na-eche na Chineke na-anwale anyị, ma ọ bụ nke ka njọ, na-anwa anyị k’anyị dabanye na mmehie. Mana Jemis 1:13 ga-eme ka anyị chee echiche dị iche.
Chineke abụghị isi iyi nke ọnwụnwa. N'eziokwu, Jemis kwuru sị na apụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke ọnwụnwa. Nke a pụtara na, ekwesịghị ijikọta Chineke ya na ihe ọ bụla gbasara mmehie.
N'ebe ọ bụla ị hụrụ mmehie ọ bụla, Chineke dị anya n’ebe ahụ.
Jemis gwara anyị na ọnwụnwa na-esite n'ọchịchọ nke aka anyị.
Ọchịchọ anyị, ọchịchọ anyị ndị na-adịghị ekwenyere Chineke.
Ọ bụ ya mere Jemis ji kwuo na a na-anwa anyị ọnwụnwa mgbe ọchịchọ ọjọọ anyị dọkpụụrụ anyị.
Jemis gwara anyị na ọ bụ anyị kpatara mmehie nke anyị. A na-anwa anyị ọnwụnwa mgbe anyị kwere ka ọchịchọ anyị chịa anyị, kama inyefe ha n'aka Chineke.
Gịnị ka anyị ga-eme ma ọnwụnwa chee anyị ihu?
Ghọta na Chineke abụghị isi iyi nke ọnwụnwa, buru ibu ọrụ ọchịchọ nke onwe gị ma nyefee ha n'aka Chineke.
Ekpere:
Ezigbo Nna, nyere m aka ịhụ ọchịchọ m otu ha dị. Nyekwa m amara iji nyefee ha n'aka gị tupu ha adọkpuru m. Amen
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Echiche Akwụkwọ Nsọ banyere Jems 1:12-16: Ịmara isi iyi nke ọnwụnwa na ịghọta usoro nke na-eduga ná mmehie, ga-enyere onye ọ bụla kwere ekwe aka ibi ndụ na-atọ Chineke ụtọ.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d