Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AgụụIhe Atụ

Agụụ

ỤBỌCHỊ 2 NKE 4

Agụụ bụ DNA nke David

Ma ọ̀ dị mma ma ọ dị njọ, o nwere ụfọdụ ihe I wetere n’aka nne na nna gị. Ọ bụrụ na ị nwere ụmụaka, ọ ga-abụ na ị chọpụtala etú ha si yie gị. Ụfọdụ n'ime ihe ị ketara maọbụ nyefee bụ nzụlite - omume amụtara amụta - na ụfọdụ n’ime ọdịdị ya – so na DNA gị. A kọwara Devid n’ime Akwụkwọ Nsọ dị ka nwoke na-eso obi Chineke. Nke ahụ pụtara na o yiri Chineke. O chere echiche, nwee mmetụta, ma mee omume n'ụzọ na-asọpụrụ Chineke ma yie àgwà nke Chineke. Anyị nwekwazịrị ike imenwu ya, ịzụlite DNA nke David: ịghọ ndị agụụ Chineke na-agụ, na-agbaso Ya site n'ime ka anyị na ụzọ Ya gakọọ.

Agụụ Chineke pụtara na oge niile agụụ ya ga na-agụ anyị, anyị a na-achọkwa obi Chineke mgbe niile. Devid kwuru na agụụ Chineke na-agụ ya, na-ekwu na ọ na-agụsi ya agụụ ike ka mgbada si efe mmiri. Ikekwe ọ nwetụla oge udi ọnụnụọkụ n’obi a na-anụ gị ịnọ n’ihu Chineke. Ikekwe n'oge ndị ọzọ akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi gị nkụ maka ihe ọzọ karịa Chineke. Ikekwe ị nwere ike ikwe ka agụụ na-efe efe nke Devid nwere maka Chineke kpalie gị ibi ndụ nke na-atọ ụtọ ịnọ n’ihu Ya ruo mgbe ebighị ebi. Gbalịa ịdị na-akpachapụ anya n’iwepụta oge gị maka ndị na-egosipụta ụdị mmasị a, iji mụta ihe site na omume ha, mara ihe ndị ha na-ebute ụzọ, maọbụ usoro ime mkpebi ha.

Okwu Devid n’Abụ Ọma 63 na-ekpughekwu agụụ ya n’ebe Chineke nọ na nghọta ya, na ndụ enweghị Chineke bụ ihe efu na ihe lara n’iyi. Abụ ọma a na-egosi na nnukwu uru dị n’iji obi gị dum na-achọ Chineke bụ ihe ùgwù nke ịhụ ike na ebube Ya, nke na-agbanwe anyị n’oyiyi ya. Otu nwoke maara ihe ekwuola na ọ dịghị mgbe a na-ahụ Chineke na mberede, ihe ọ na-egosi bụ na ọ dịịrị anyị ịhọrọ ịchụso Chineke n’akwụsịghị akwụsị, mara ụma na-eme ya, na n’obi anyị dum. Mgbe ihe a kpọrọ mmadụ dabara ná mmehie, ọdị mma anyị na Chineke funahụrụ anyị. Mmehie mere ka obi sie anyị ike ma ghara ịhụ Chineke na ndị ọzọ n'anya. Ma, n’agbanyeghị na anyị bụ ndị ruru unyi na ndị nnupụisi, Chineke ji ịhụnanya mgbapụta Ya chụsoo anyị. Ka anyị malite ịma ụma na-achụso Chineke n'oké ịhụnanya, dị ka ọ si chụso anyị. Anyị ga-amalite ịchọ Ya karịa ihe niile. Anyị ga-ebu ụzọ chọọ Ya ma nọrọ n’ihu Ya ọtụtụ mgbe n’ụbọchị. Ọ bụ Ị na-eche banyere ya ka anyị dị ndụ, bụ ihe ga-enyere anyị aka iburu Ya n’echiche anyị.

Ọ bụrụ na ị nabatabeghị Jizọs dị ka Onyenwe gị na Onye Nzọpụta nke ndụ gị, mee nke ahụ taa. Nye ya ohere iji ịhụnanya Ya gbanwee ndụ gị n’ụzọ dị omimi. Ka ị mara na iji obi gị niile chọọ Chineke bụ ịchọta Ya. Ma mee ka ị mara na ịchọta Ya bụ ịdị ka Ya, na ịhụ akụnụba nke ebube Ya.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Agụụ

Atụmatụ maka ụbọchị anọ a na-enyocha etú agụụ na-agụ anyị ịmata Chineke ma mee kà amata Ya, sì àkpali anyị n’ime nzube Ya maka ndụ anyị. Chọpụta ihe mere Devid ji bụrụ nwoke na-eso obi Chineke - na etu gị onwe gị ga-esi ebi ndụ na-enwe mmasị n'ebe Chineke nọ, na-egori mmekọrịta gị na Jizọs, na-atụkwasị ya obi ka o gboo mkpa gị. YouVersion chepụtara atụmatụ a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Lawrence Oyor maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.youtube.com/lawrenceoyor