Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 63

63
Abù Ọma Devid, mb͕e ọ nọ n'ọzara Juda.
1Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike:
Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike,
N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi.
2Otú a ka m'lekwasiworo Gi anya n'ebe nsọ gi,
Ihu ike-Gi na nsọpuru-Gi.
3N'ihi na ebere-Gi di nma kari ndu;
Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāja Gi.
4Otú a ka m'gāgọzi Gi mb͕e m na-ādi ndu:
N'aha-Gi ka m'gāchili akam elu.
5Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ;
Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi;
6Ọ buru na echetam I n'elu utem,
Nime nche-abali nile ka m'nātughari uchem na Gi.
7N'ihi na I buworom iye-aka,
Ọ bu kwa n'okpuru ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'nēti nkpu ọṅù.
8Nkpuru-obim nārapara Gi n'aru n'iso Gi n'azu:
Mu ka aka-nri-gi jideworo.
9Ma ndi ahu, ọ bu ime ka ọ la n'iyì ka ha nāchọ nkpuru-obim,
Ha gābà n'ebe nile di ala nke uwa.
10Agarara ha nye n'aka mma-agha:
Òkè nke nkita-ọhia ka ha gābu.
11Ma eze gāṅuri na Chineke:
Onye ọ bula nke nēwere Ya ṅu iyi gānya isi;
N'ihi na agēkpuchi ọnu nke ndi nēkwu okwu-ugha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 63: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye