Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 62

62
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; dika Jedutun si abù abù. Abù Ọma Devid.
1Ọ bu nání Chineke ka nkpuru-obim nēdere du:
N'aka-Ya ka nzọputam si bia.
2Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam:
Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum ri nne.
3Rùe ole mb͕e ka unu ganāwagide madu?
Unu nētipia ya, unu nile,
Dika mb͕idi ruru eruru, dika ogige nke anēnuda enuda.
4Ọ bu nání isi na nbuli-elu-ya nupu ya ka ha b͕aworo ìzù;
Okwu-ugha nātọ ha utọ:
Ha nēji ọnu-ha agọzi, ma n'ime obi-ha ha nākọcha akọcha. Selah
5Nēdere nání Chinek du, nkpuru-obim;
N'ihi na ọ bu Ya ka olile-anyam si puta.
6Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam:
Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum.
7N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di:
Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke.
8Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya;
Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri:
Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah
9Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu,
ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu:
N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe;
Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.
10Unu atukwasila obi na nmeb͕u,
Ọzọ, n'ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu:
Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi.
11Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu,
Ub͕ò abua ka m'nuworo nka;
Na ike nile bu ihe Chineke nwere:
12Ọ bu kwa Gi nwe ebere, Onye-nwe-ayi:
N'ihi na Gi onwe-gi nākwughachi madu ọ bula dika ọlu-ya si di.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 62: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye