Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 61

61
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu ubọ-akwara. Abù Ọma nke Devid.
1Chineke, nuru olu iti-nkpum;
Ṅa nti ekperem.
2M'nēsi na nsọtu uwa kpọkue Gi, mb͕e, obim nādighi ike:
Rue n'oké nkume nke kam elu ka I gēdurum je.
3N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà,
Ulo-elu di ike ipu n'iru onye-iro.
4Ka m'nọ dika ọbìa n'ulo-ikwū-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi:
M'gāb͕abà n'ebe-nzuzo nke nkù-Gi abua. Selah
5N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m'kwere:
I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha.
6I gātukwasi ọtutu ubọchi n'ubọchi ndu eze:
Arọ-ya nile gādi ka ọtutu ọb͕ọ.
7O gēbi n'iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi:
Wezuga ebere na ezi-okwu, ka ha we nēchezi ya.
8Otú a m'gābùku aha-Gi abù ọma rue mb͕e ebighi-ebi,
Ka m'we kwughachi nkwam nile kwa-ubọchi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 61: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye