Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AgụụIhe Atụ

Agụụ

ỤBỌCHỊ 1 NKE 4

Agụụ dị ka ihe Mkpalite Ichokwu Ọzọ

Agụụ na-agụ ndị dị iche iche n’oge dị iche iche n’ụbọchị. Ụfọdụ ndị na-eri nri ugbo atọ n’ụbọchị. Ụfọdụ ndị mmadụ na-atacharị ihe ntacha n’etiti. Agụụ bụ otu n’ime ndaunusoro mere mmadụ ji bụrụ mmadụ. Anyị niile kwesịrị iri nri. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na agụụ anụ ahụ́ anyị na-egosi eziokwu dị omimi nke ime mmụọ: e mebere anyị ka agụụ Chineke na-agụ anyị.

Iso ụzọ Kraịst gbadoro ụkwụ na mmekọrịta anyị na Chineke site n'aka Jizọs, n'ihi ya, ọ na-egosi na anyị kwesịrị ịdị na-aga n'ihu, na-abawanye ụba, na-eto eto n’agụụ anyị ịmata Ya nke ọma na ibi n'ihu Ya. Jizọs sị na a ga-agọzi ndị agụụ na-agụ na ndị akpịrị na-akpọ nkụ maka ezi omume n’ihi na afọ ga-eju ha. Ikekwe, ị makwa nke ọma maka ihe mgbu nke agụụ ime mmụọ nke gị. Ikekwe enwere akụkụ nke ndụ gị nke chọrọ imejupụta n’ezi omume Chineke.

Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ rụghachiiri ndị mmadụ aka azụ n’ihe mbụ Chineke bu n’obi bụ ezi mkpakọrịta ha na Ya. Site ná mmalite, Chineke chọrọ ndị ọchịchọ Alaeze Ya kpuchiri ihe niile, bụ ndị agụụ Ya na-agụ. Jizọs ṅomiri eziokwu a mgbe ọ gwara ndị enyi ya na, ihe oriri ya bụ ime uche Nna ya, nakwa na, onye ọbụla nke akpịrị na-akpọ nkụ pụrụ ịbịakwute ya ka ọ ṅụọ mmiri na-enye ndụ n’efu.

Agụụ maka Chineke - ọchịchọ nke a ka adọbata n’ime ahụmihe mara mma nke ịmara Ya - bụ ihe na-ejikọta ndị nke Chineke ọnụ n’akụkọala niile. Ịmara Ya na-akpali anyị n’ime nzube Ya maka ndụ anyị. Ịmara Ya pụtara na anyị ga-esonye n’Alaeze Ya, na-aga n’ihu n’ụwa niile n’ike Chineke.

Ndị mbụ na-eso ụzọ Jizọs ghọtara na ndụ n’ụwa abaghị uru, ọ gwụla ma ha raara onwe ha nye kpam kpam n’ibi ndụ maka Chineke. Pọl dere na ịhụnanya Kraịst na-amanye anyị ka anyị ghara ịdị ndụ ọzọ maka onwe anyị kama maka Onye ahụ nke nwụrụ n’ihi anyị. Ndụ ọbụla a na-ebi n’enweghị agụụ nke Chineke ga-adabere n’onwe ya na ihe ndị na-eme n’ezie nke na-emebi emebi nke ụwa a. Ndụ dị otú ahụ enweghị ike isonye na mmekọrịta dị ebube nke anyị na Chineke na-enye anyị ike iguzobe Alaeze Ya n’ụwa ebe a.

Ka agụụ Chineke na-agusi anyị ike, anyị ga-abịa ghọta na ịmara Ya enweghị njedebe. Wepụta oge iji chọpụta ogo agụụ gị. Ka Chineke bawanye ọchịchọ gị ịmara Ya, mee ka amara Ya banye n’ime atụmatụ na ebumnuche Ya maka ndụ gị. Ka O mee ka nghọta gị dị nkọ na ọ dịghị ihe ọzọ a na-enye sitere n'ụwa ga-eju mkpụrụ obi gị afọ. Ka ị na-anwa ibi ndụ maka naanị Jizọs.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Agụụ

Atụmatụ maka ụbọchị anọ a na-enyocha etú agụụ na-agụ anyị ịmata Chineke ma mee kà amata Ya, sì àkpali anyị n’ime nzube Ya maka ndụ anyị. Chọpụta ihe mere Devid ji bụrụ nwoke na-eso obi Chineke - na etu gị onwe gị ga-esi ebi ndụ na-enwe mmasị n'ebe Chineke nọ, na-egori mmekọrịta gị na Jizọs, na-atụkwasị ya obi ka o gboo mkpa gị. YouVersion chepụtara atụmatụ a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Lawrence Oyor maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.youtube.com/lawrenceoyor