Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AgụụIhe Atụ

Agụụ

ỤBỌCHỊ 3 NKE 4

Agụụ n’Ụwa Dara Àdà

Eleghị anya, ị na-arọ nrọ imeri lọtrị maọbụ iketa nnukwu ego. Ị kpebielarị ihe ị ga-eji ego ahụ niile mee. N’ezie, onyinye ọbụla dị mma na nke zuru òkè sitere na Chineke, ọ bụkwa ya na-enye anyị ihe niile. Mana a na-akpọ anyị n’ihe karịrị naanị ịchụso akụ̀ na ụba maọbụ afọ ojuju nke ụwa. Nna gị nke Eluigwe hụrụ gị n’anya chọrọ ka ị mata ọnyà nke agụụ maka ihe ndị a sitere n’ụwa na-ebute, na nnukwu udo na ọṅụ nke ị ga-enweta mgbe agụụ Jizọs na-ebu ụzọ agụsị gị ike.

Jizọs chọpụtara na ụfọdụ ndị ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ ya, ma obi ha dị anya n’ebe ọ nọ. N’ụzọ dị mwute, nke a na-ada ka eziokwu banyere ụka dị n’ọgbọ anyị, bụ nke echiche ụwa metụtarala n’ụzọ dị ukwuu. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ Ndị Kraịst bụ́ ndị agụụ akụnụba na ọdịmma na-agụ karịa etu agụụ Jizọs si agụ ha. Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị jụọ onwe anyị ma ànyị na-achọ Chineke n’ihi ihe onwunwe (dị ka ụzọ ọgwụgwụ), maọ̀bụ na anyị na Ya na-akpakọrịta naanị n’ihi na agụụ imatakwu Ya na-agụ anyị.

Jizọs kọwaara ndị na-eso ụzọ ya na ndị na-ekweghị ekwe (n’ụbọchị Ya, ndị Jentaịl) na-achọsi ihe ha ga-eri, aṅụ na ihe ha ga-eyi ike. Ma ozugbo ndị mmadụ natara ihe ndị a n’aka Chineke, bụ́ onye na-enye ha, ịnụ ọkụ n’obi ha maka ichụso ihe ime mmụọ na-anyụ ọkụ. O nwere ike ịbụ na ị hụla ka nchegbu na anyaukwu na-anọchi agụụ Chineke n’eziokwu, n’ụlọ ụka gị maọbụ n’obodo. Ọ ga-ekwe omume na ị na-amatawanye na a na-akpọ gị na ndị kwere ekwe ibe gị ka ị na-eṅomi ibi ndụ n’ụzọ ejighi ihe onwunwe kpọrọ ihe.

Ozi Jizọs enweghị mgbe o ji kwalite ụdị agụụ ihe onwunwe maọbụ anyaukwu nke ihe onwunwe a na-egosipụta na omenala anyị taa, n’ihi ya, anyị adịghị anwa anwa ejikọta iso Ya na uru nke ụwa. Ọ dịghị ihe dị n'ụwa dị mkpa ka ịmara na inye Chineke otuto. Ka anyị tinye mmụọ anyị n’ime ka anyị bute ịchọ Ya ụzọ - karịa ihe ndị ọzọ niile – na n’enweghị atụmanya ọzọ nke ụgwọ ọrụ ma ewezuga ọṅụ nke ịmara Ya na ime ka a mara Ya.

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Agụụ

Atụmatụ maka ụbọchị anọ a na-enyocha etú agụụ na-agụ anyị ịmata Chineke ma mee kà amata Ya, sì àkpali anyị n’ime nzube Ya maka ndụ anyị. Chọpụta ihe mere Devid ji bụrụ nwoke na-eso obi Chineke - na etu gị onwe gị ga-esi ebi ndụ na-enwe mmasị n'ebe Chineke nọ, na-egori mmekọrịta gị na Jizọs, na-atụkwasị ya obi ka o gboo mkpa gị. YouVersion chepụtara atụmatụ a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Lawrence Oyor maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.youtube.com/lawrenceoyor