Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

OKWUKWE; ỤZỌ IME IHE NA-ATỌ CHINEKE ỤTỌIhe Atụ

OKWUKWE; ỤZỌ IME IHE NA-ATỌ CHINEKE ỤTỌ

ỤBỌCHỊ 2 NKE 3

Okwukwe na Ntụkwasịobi na Nkwa Chineke

Ọ pụrụ ịbụ ihe na-akpali mmasị ịmara na ọ bụghị naanị na a kpọrọ Ebraham nna nke okwukwe. Ndụ Ebraham biri bụ ngosipụta nke ndụ e rere kpam kpam iji nwee okwukwe na Chineke na ịtụkwasịkwa nkwa ya obi.

Na mbụ Chineke gwara ya ka ọ hapụ ụlọ nna ya na ndị ikwu ya, pụọ n’ebe ọ gaara anata ihe nketa na ọdịnihu gaa n’ebe ọ ga-abụ na o nweghị olileanya. N’ụzọ dị ịtụnanya, Ebraham ji nkwuwa okwu mee ihe a. M ga-akpọ nke a nzọụkwụ nkwuwa okwu n’ihi na, enweghị m ike iche maka ige ih a na-adịghị ahụ anya ntị, nke na-enye m ntụziaka ịhapụ ebe m maara, nke ọma gaa ebe m na-ejighị n’aka. Ọ nwere ike ikwe ịghọta ma asị na amaara m ebe m na-aga, mana ọ bụrụ maka ebe m na-amaghị ihe na-echere m ebe ahụ, ọ bụ nzọụkwụ nkwuwa okwu. Ma site n’okwukwe Ebraham biri n’ebe a ma mụta ọgbọ dị iche iche n’ala ọzọ a.

Chineke nyekwara ya nkwa nke nnwa, ọbụna n’agadi, mgbe o dị ka ọ gaghị ekwe omume ịmụ nnwa, ma site n’okwukwe Ebraham na Sera jisiri okwu Chineke ike, nwee ike ịmụta Aịzik n’agadi ahụ. Chineke nyekwara ya nkwa, na ụmụ ya ga-adịkwa ka ájá nke oké osimiri na dị ka kpakpando nke eluigwe.

Ihe atụ abụọ a gosipụtara ka Ebraham si gosipụta okwukwe site na nrubeisi na ntụkwasị obi na nkwa nke Chineke nyeere ya aka inwe ike ịbanye na mmezu ahụ. Ọ ga-esi ike ịbanye na mmezu nke nkwa Chineke kwere anyị ma ọ bụrụ na anyị enweghị okwukwe na ntụkwasị obi n’eziokwu na o kwere nkwa ndị a. Jemes 1, mere ka anyị ghọta na o nweghị obi abụọ ọbụla nwere ike ịnata ihe ọbụla n’aka Chineke. Banye n’ebe ntụkwasị obi zuru oke ma kwere na nkwa Chineke ka ị nwee ike ịnụ ụtọ mmezu nke nkwa ya maka anyị.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

OKWUKWE; ỤZỌ IME IHE NA-ATỌ CHINEKE ỤTỌ

Mgbaghara bụ otu ibe dị oke mkpa na ndụ onye Kraịst, maka iji nwee udo na udi mmekọrịta na-eto eto n’ebe ya na Chineke na mmadu nọ. Ọ bụghị naanị na Jizọs ji ndụ ya kọwarịgharịa mgbaghara site na nkuzi ya, o nyekwazịrị amara achọrọ iji nara ma nyekwa mgbaghara site na Mmụọ ya. Enyela nwa Chineke ọbụla ike irube isi n’iwu Chineke nyere ka agbaghara ndị ọzọ otu e si gbaghara ha.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/