Jehova we si Abram, Si n'ala-gi, si kwa n'umu-nna-gi, si kwa n'ulo nna-gi, je nke gi rue ala ahu nke M'gēme ka i hu ya anya: M'gēme kwa gi ka i ghọ mba uku, M'gāgọzi kwa gi, me ka aha-gi di uku; gi buru kwa ngọzi: M'gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bu kwa onye nākọcha gi ka M'gābu ọnu: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke uwa nime gi. Abram we je, dika Jehova gwara ya okwu; Lot we so ya je: Abram b͕ara ọgu arọ atọ na iri na ise mb͕e o siri na Heran pua. Abram we chiri Serai, bú nwunye-ya, na Lot, bú nwa nwa-nne-ya, na àkù-ha nile nke ha kpatarari, na madu ndi ha nwetarari nime Heran; ha we pua ije ala Kenean; ha we ba n'ala Kenean. Abram we gabiga n'ala ahu rue ebe Shekem, rue osisi terebinth nke More. Ndi Kenean nọ n'ala ahu mb͕e ahu. Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M'gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n'ebe ahu. Ọ we si n'ebe ahu kwapu je ugwu ahu di n'Iru-anyanwu Bet-el, ọ ma ulo-ikwū-ya, Bet-el di n'Ọdida-anyanwu, Ai di n'Iru-anyanwu: o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova. Abram we bulie ije, nēje nēbuli kwa ije n'uzọ Negeb.
Gụọ JENESIS 12
Geere nke a ntị JENESIS 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 12:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị