Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

OKWUKWE; ỤZỌ IME IHE NA-ATỌ CHINEKE ỤTỌIhe Atụ

OKWUKWE; ỤZỌ IME IHE NA-ATỌ CHINEKE ỤTỌ

ỤBỌCHỊ 1 NKE 3

Ịghọta Okwukwe

Ndị Hibru 11:1 kowara okwukwe dị ka nkwenye n’ihe a na-atu anya ha, nkwenyesiike n’ihe a na-ahụghị anya. Okwukwe bụ ngwa ọrụ dị mkpa achọrọ n’ịga ije anyị na Chineke dị ka ndị kwere ekwe. Ọ ga-esi ezigbo ike iso Chineke na-eje ije nke ọma ma ọ bụrụ na enweghị isiokwu nke a bụ okwukwe. Anyị enweghị ike ịhụ Chineke ihu na ihu, mana mmekọrịta anyị na Chineke bụ nke a na-eme site n’ike nke okwukwe. Akwụkwọ niile nke Ndị Hibru 11 na-ekwu maka ngọzi nke okwukwe na ka ndị nna ochie dị iche iche si soro Chineke jee ije nke ọma.

Ndị Hibru 11 amaokwu 6 na-akọwa na ewezuga okwukwe, ọ gaghị ekwe omume ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Anyị nwere ike ime ihe na-atọ Chineke ụtọ naanị site n’okwukwe. Anyị na Chineke na-akpakọrịta naanị site n’ihe ọmụma anyị nwere banyere Ya, ọ bụghị n’ihi na anyị nwere ike ịhụ Ya ihu na ihu. Ya mere, amaokwu nke Akwụkwọ Nsọ gara n’ihu na-ekwu na onye ọbụla ga-abịakwute Chineke aghaghị ikwere na Ọ dị. Nke a pụtara na ị ga-ekweta na Chineke dị. Nke a bụ naanị ụzọ ga-enyere gị aka na mmekọ, ikpe ekpere na nkwurịta okwu. Nke a bụ nnọọ ihe dị mkpa ịbata n’ime ya n’ihi na anyị apụghị ịhụ Chineke n’anya nkịtị, ma anyị ga-enwe ike iji uche anyị hụ Ya, nakwa na mmụọ anyị si na-ahụ ya na uche anyị, na na mmụọ anyị. Nghọta na amamihe anyị enweghị ike ịghọta nke a ma ọlị.

I ji maa atụ, n’amaokwu nke 4, Ebel ahụghị Chineke, ma ọ chụụrụ Chineke àjà dị nnọọ mma karịa nwanne ya Ken. Ọ kaara ikpebi inye ihe ọbụla n’àjà, mana, Ebel họọrọ ịchụrụ Chineke àjà kasị mma. O nwere okwukwe nke ukwuu na o kwenyere na enwere Chineke nọ n’elu ebe ahụ nke kwesịrị ihe magburu onwe ya, ọ bụghị naanị ihe ọbụla.

N’amaokwu nke 7, Noa kwadebere ụgbọ iji zọpụta onye ọbụla ga-achọ ige ntị banyere ihe ize ndụ nke iju mmiri na-abịanụ. Noa nwere okwukwe nke ukwuu mgbe Chineke nyere ya ntụziaka ahụ. Nke mbụ, o kwetere ihe Chineke gwara ya na iju mmiri na-abịa, o kwekwara na ụgbọ ahụ ga-abụ amara nzọpụta site n’ịbụ onye iju mmiri a metụtara.

N’amaokwu nke 8, Ebreham rubeere Chineke isi mgbe a gwara ya ka ọ gaa n’ebe a ga-egosi ya. Ọ bụ naanị naanị okwukwe bụ ihe nwere ike ime ka o mee njem gaa n'ala ebe a na-amaghị, n’agbanyeghị na enweghị ntụzịaka maọbụ ihe ọmụma e nyere ya. Ọ zọpụrụ ụkwụ ahụ n’ihi na ọ maara na Chineke ga na-edu ya ka ọ na-eme njem ahụ.

Ndị nna ochie ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ gosipụtara ihe atụ ndụ nke okwukwe na ntụkwasị obi zuru oke n’ịdị elu na iguzosi ike n’ezi ihe nke Chineke. Nke a bụ ụzọ kacha mma isi mee ihe na-atọ Chineke ụtọ.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

OKWUKWE; ỤZỌ IME IHE NA-ATỌ CHINEKE ỤTỌ

Mgbaghara bụ otu ibe dị oke mkpa na ndụ onye Kraịst, maka iji nwee udo na udi mmekọrịta na-eto eto n’ebe ya na Chineke na mmadu nọ. Ọ bụghị naanị na Jizọs ji ndụ ya kọwarịgharịa mgbaghara site na nkuzi ya, o nyekwazịrị amara achọrọ iji nara ma nyekwa mgbaghara site na Mmụọ ya. Enyela nwa Chineke ọbụla ike irube isi n’iwu Chineke nyere ka agbaghara ndị ọzọ otu e si gbaghara ha.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/