Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌCHỊCHỊIhe Atụ

ỌCHỊCHỊ

ỤBỌCHỊ 3 NKE 3

ÍKWÁDÓ NDỊ NDU

Ò nwetụla mgbe ị riri nri dị ụtọ nke ọ na-adị gị ka gị rilkwuo ya? Ọ bụghị naanị gị kwụ n'ihi na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na onye ọbụla eriela udi nri dị etú ahụ. Mana otu ihe ị kwesịrị ịma gbasara nri ahụ bụ na ọ gafeela usoro dị iche iche dị ka òbùbè, òsisi, ọghịghe, wdz.

N’otu aka ahụ, ụmụ nwoke anaghị aba n’ọkwa ọchịchị ma ọbụghị ma Chineke siri ya ma kwadoo ha. Ebe Chineke na-esi nri anaghị adịkarị ụtọ mgbe niile mana nri esichara na ya na-ama mma. Mgbe Chineke na-ahọrọ nwoke ịbụ onye ndu, Ọ na-akpọga ya n’ebe a na-egwupụta nkume maka igbuji, ịkpụzi na ịkwado tupu Ọ̀ kpọbata ya ka ọ wuo ụlọ n’alaeze Ya. Ọtụtụ n'ime ndị ndu na-eme nke ọma n’akụkọ ihe mere eme agawo n’ebe a na-egwupụta ihe nke Chineke maọbụ ụlọ nri. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Ọ na-akwadebe ha n’ikike na ume ha chọrọ iji duo ndị Ya.

Ya mere, ọ dị mkpa ka ị ghara ịgbanarị usoro isi na ịbechasi gị n’ihi na ha ga-eme ka ị dabaa maka ọkwa ndu nke Chineke na-ebute gị. Josef bụ nwoke jupụtara n’ahụmahụ ndị na-adịghị mma malite mgbe ọ bụ nwata, ma ihe nyeere ya aka iru n’ọkwá ya bụ́ isi n’Ijipt bụ na ọ nọgidere n’usekwu nke Chineke. Devid, nwoke na-eso obi Chineke na eze a hụrụ n’anya n’Izrel nwere ọtụtụ ihe mgbochi na ihe ịma aka ihu ka ọ na-arịgoro n’ubube gaa n’ọchịchị. Otu n’ime ọnwụnwa kasị njọ chere ya ihu mgbe o nwere ohere igbu onye iro ya nke mbụ (eze Sọl) maọbụ hapụ ya ka ọ dị ndụ. N’ozuzu, ọ hapụghị ebe ngwuputa nkume nke Chineke. Tupu Timoti aghọọ onye ndú n’ọgbakọ, o doro onwe ya n’okpuru usoro osisi nri nke Chineke n’aka Pọl onyeozi.

Ọmụmaatụ ndị ọzọ bụ Jọshụa, Elaịsha onye wụsara mmiri n’aka nke Ịlaịja, Nna Abraham, Moses... naanị ikwupụta ole na ole. Agafela maọbụ gbapụ n’ebe a ngwuputa nkume nke Chineke, nọrọ ka O mee ka ị bụrụ onye ndu ị kwesịrị ịbụ.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

ỌCHỊCHỊ

Ọchịchị bụ otu n'ime ihe Chineke na-eji na-amụcha ma kwado ndị Ya maka ndụ alaeze na ime oke ihe. Nzube na-edowaga anya, ebe njem ndụ na-adị nro site n’ọchịchị ziri ezi. Ya mere, Chineke na-ama ụma akpọku na inye ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nke ga-emezu ọkpụkpọ oku a ike

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/