Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌCHỊCHỊIhe Atụ

ỌCHỊCHỊ

ỤBỌCHỊ 1 NKE 3

ỌCHỊCHỊ KA CHINEKE SI AHỤ YA

Otu n’ime ihe mmadụ kacha achọ bụ ịnọ n’elu, na-achịkwa mmadụ na ihe ndị ọzọ. Mmadụ chọrọ ịchị achị karịa ka a na-achị ya. Onye ọbụla chọrọ ka a hụ ya, kwanyere ya ùgwù ma bụrụ ‘onye isi n'etiti mmadụ niile’. Ọ bụ naanị ọchịchọ a ka ọtụtụ ndị ji kwabanye onwe ha n’ọchịchị wee kpuo ụgbọ mmiri ya. Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị ghọta nke ọma ihe ọchịchị bụ na etú Chineke si ele ya anya. Echiche abụọ a bụ isi kwesịrị ka e buru ya n'uche:

1. Ọchịchị bụ ọkpụkpo ̣òkù:

Chineke na-akpọ ndị mmadụ n’ime ọchịchị, zụọ ma nye ha amara maka ya. Ya mere, ọ na-ewe ndị a kpọrọ, zụọ ma bụrụ ndị natakwara amara sitere na Chineke ka ha duo nke ọma. Ụmụ nwoke dị ka Moses, Erọn, Jọshụa, Elaịsha, Devid, Pọl, ndị ozi iri na abụọ ahụ na ndị ọzọ ewegharaghị/manye ha ịbanye n’ọkwa ndị ndu kama Chineke họpụtara ha. “Ọ dịghịkwa onye ọbula na-anara nsọpuru a nye onwe ya, ma ọbụghị onye Chineke kpọrọ, dịka akpọworo Eron.” Ndị Hibru 5:4

2. Ije ozi bụ ụzọ e si agbago n’ọchịchị. Mat 20:25-28, Mak 10: 44.

Jizọs Kraịst kpughere nke a mgbe ọchịchọ ịchị/idu selitere n’etiti ndị na-eso ụzọ Ya. O mere ka ndị ozi ahụ mara na onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onyeisi n’etiti ha ga-abụ odibo. Onye ndu ga-abịa ije ozi karịa ijere ya ozi. Ọ ga-ejere ndị akpọrọ ya idu ozi. Jizọs gosipụtara ihe atụ a, nke ịbụ onye ndu na-eje ozi site n’ijere mkpa mmụọ, ego na anụ ahụ nke ndị na-eso ụzọ Ya ozi. O nwedịrị oge ọ sara ha ụkwụ nke bụụrụ onye ndu n’oge ya ihe nnweda onwe ala. Lee, Ọ bụ ezi onye ndu enweghi ntụpọ!

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

ỌCHỊCHỊ

Ọchịchị bụ otu n'ime ihe Chineke na-eji na-amụcha ma kwado ndị Ya maka ndụ alaeze na ime oke ihe. Nzube na-edowaga anya, ebe njem ndụ na-adị nro site n’ọchịchị ziri ezi. Ya mere, Chineke na-ama ụma akpọku na inye ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nke ga-emezu ọkpụkpọ oku a ike

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/