Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌCHỊCHỊIhe Atụ

ỌCHỊCHỊ

ỤBỌCHỊ 2 NKE 3

NNWALE MKPEBI NKE NDỊ ỌCHỊCHỊ

(Àgwà ndị Kwesịrị Onye Ọchichị)

Onye ọchịchị bụ onye:

1. Sịrịla 'Ee' nye Chineke

Ọchịchị gụnyere mmadụ inyefe onwe ya niile maọbụ ihe niile o nwere n’aka Onyenwe anyị. Irubere onye họpụtara ya n’ọkwa ọchịchị isi kpam kpam dị ezigbo mkpa n’ihi na Ọ bụ ya na-eduzi omume ụmụ mmadụ (ma ndị ndu ma ndị na-eso eso). Ọ dịịrị ndị mmadụ mfe iso onye na-eso Chineke. “Bụrụnụ ndị na-eso m, ọbụna dị ka m bụkwa nke Kraịst.” 1 Ndị Kọrịnt 11:1.

2. Na-achịkwa Onwe Ya nke Ọma

Otu àgwà dị mkpa nke onye ndu bụ ikike ịchịkwa onwe ya. Nwoke maọbụ nwaanyị ahụ ga-enwe ike iweta ahụ ya ‘n’okpuru’ uche nke Onyenwe anyị na ‘n'elu’ odudu nke anụ ahụ. Njide onwe-onye, ọzụzụ onwe-onye, ime ihe ziri ezi n'oge kwesịrị ekwesị, ịnọ n’ebe dị mkpa n’agbanyeghị ka o si dịrị ya ... bụ ụfọdụ n’ime ọzụzụ onwe-onye nke onye ndu. Ilu 25:28, 1Kọrint 9:27.

3. Nwee Nkà

Onye ndu ga-enwerịrị ihe ọmụma banyere ndị ọ na-edu ma na-echepụta uzo isi duo ha site n’oge dị iche iche na usoro nke mbọ ha na-agba na ndụ. Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere etú eze Devid si nwee nkà n’idu ndị Chineke. “O we zụ̀a ha dịka izu okè nke obi Ya si dị; Werekwa ihe nghọta niile nke obu aka ya abụọ na-edu ha.” Abụ Ọma 78:72.

4. Dị Umeala n’Obi ma Nwee Ndidi

N’ihi na ndị a na-edu si n’ebe dị iche iche, nwee echiche na ahụmihe dị iche iche nke nwere ike imetụta ụzọ ha si eche echiche na imeghachi omume n’ọnọdụ ọbụla, ya mere a na-atụ anya na onye ndu ga-enwe ndidi ma dị umeala n’obi n’etu ya na ha si emekọ ihe. Dị ka onye ọzụzụ atụrụ kwesịrị ịdị nwayọọ n’idu atụrụ dị iche iche (nwata, okenye, ndi dị ime, wdg) otu ahụ ka onye ndu ga-adịkwa. Jizọs biri ndụ ihe nlere anya dịka onye ndu, na-egosi ka O si dị umeala n’obi, nwee ndidi na obi umeala n’ebe ndị a na-ahụ anya o duru nọ, mgbe o nọ n’ụwa. Mt 11:29, Fil 2:3-4 .

5. Na-Enwe Ọmịiko na Ntinye Uche

Inwe ezi ịhụnanya maka ndị ọ na-edu bụ àgwà dị mkpa nke ezigbo onye ndu. Moses gosiri etu obi ebere o nwere n’arụ ụmụ Izrel si dị mgbe o guzoro n’etiti ha n’iru Chineke ka ewee ghara ibibi ha. Abụ 106:23, Mt 9:36.

6. Na-Azụlite ma na-Elekọta Ndị Ọ na-Edu

Ezigbo onye ndu na-elekọta mmụọ, anụ ahụ, ego na omume ndi ọ mmadụ. Ọ na-ama mkpa ha, ọ dịghịkwa esi n'ebe ha nọ wezụga onwe ya mgbe ha nọ n'ụkọ. ỌrụNdị Ozi 20:28, Ilu 27:23 .

7. Mee ka m mere

Otu ụzọ dị irè nke ndị ndu na-esi akuzi ma na-edu bụ ịghọ ihe ha chọrọ ka ndị na-eso ha ghọọ. Ha na-egosipụtakarị àgwà a na-atụ anya n’aka ndị ha na-edu. Mgbe ọrụ daputara, onye ndu na-ebu ụzọ rụọ ọrụ n’ihu onye ọbụla ọzọ. Jọn 13:13-15.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

ỌCHỊCHỊ

Ọchịchị bụ otu n'ime ihe Chineke na-eji na-amụcha ma kwado ndị Ya maka ndụ alaeze na ime oke ihe. Nzube na-edowaga anya, ebe njem ndụ na-adị nro site n’ọchịchị ziri ezi. Ya mere, Chineke na-ama ụma akpọku na inye ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nke ga-emezu ọkpụkpọ oku a ike

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/