Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iji Ntụkwasị Obi Ekekọrịta JizọsIhe Atụ

Iji Ntụkwasị Obi Ekekọrịta Jizọs

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Obisiike na Kọmishọn ahụ

Ozugbo Pọl kọwachaara ndị Rom na ọ bụrụ na i kwere ma jiri ọnụ gị kwupụta na Jizọs bụ Onyenwe anyị, a ga-azọpụta gị, ọ jụọ ajụjụ ndị a: Olee etú onye ọbụla ga-esi akpọku onye o na-ekweghị na ya? Kedu etú ha ga-esi kwere na Chineke ha na-anụbeghị banyere ya? Oleekwanu etú ha ga-esi nụ ma ọ bụrụ mmadụ ekwusaraghị ha ozi ọma? Kedu etu onye ọbụla ga-esi kwusaa Oziọma, ma ọ bụrụ na eziteghi ha?

Ebe ụfọdụ ga-ajụ ozi ahụ na-egeghị ntị, ọtụtụ ndị anụbeghị ozi ọma ahụ. Mmadụ kwesịrị ịgwa ha. Gịnị mere na ọ gaghị abụ gị?

Ịghọ onye na-ekwusa ozi ọma bụ maka anyị niile bụ ndị na-ekwu na anyị na-eso Kraịst. Ọ bụrụ na anyị obisiike na ndị anyị bụ na Onye anyị bụ nke ya, ozi ọma ahụ ga na-esi n’ime anyị apụta mgbe niile n’ụzọ dị mfe. Mgbe anyị dị njikere, ọ ga-adịrị anyị mfe ịkọrọ ndị ọzọ banyere Jizọs. Mgbe anyị ghọtara na ezi mgbanwe na ndụ nwere ike ịbụ naanị anyi na mmadụ ịkparịta ụka, anyị ga-achọ ohere ọbụla iji nwee mkparịta ụka ndị ahụ. Anyị nwedịrị ike imepụta ohere a.

Ọrụ gị bụ ịkọ akụkọ ahụ - ịtụba mkpụrụ nke Oziọma ahụ. Chineke ga-eme ihe ndị ọzọ. Ekwela ka o metuta gị ma ọ bụrụ na mmadụ chụrụ maọbụ jụ gị kpamkpam. Jizọs kwudịrị na ọ bụrụ na ha ajụ Ya, ha ga-ajụkwa gị. Mana nke ahụ na-eme ka oge ndị ahụ mgbe ndị mmadụ na-anabata Oziọma ahụ dị ike karịa.

Otu n’ime ihe ọgụgụ anyị taa bụ mkparịta ụka dị n’etiti Filip na ọnaozi Itiopia, mgbe Filip nọ na-eme njem na-achọ ohere iji zie ozi ọma nke Jisọs. Rịba ama obisiike Filip nwere ka ọ na-ekerịta, n'agbanyeghị na nke a bụ ọnọdụ pụrụ iche n'ebe onye ọ na-amabughị nọ. O nwetara ozi ahụ nye onye ọ na-ahụtụbeghị mbụ, bụ́ onye si mba ọzọ, sokwa n’otu akụkụ nke nwoke ahụ na-achọ ụzọ ọ ga-esi gakwuru Jizọs.

Afọ ole na ole gara aga, emere m ntakịrị nchọcha banyere Etiopia. Taa, okpukperechi kasị ukwuu e nwere bụ ekpemekpe na-eso ụzọ Kraịst, dị pacentị iri isii na atọ (63%) nke nde mmadụ otu narị na iri na atọ (113) na-azọrọ na ha kwere na Jizọs Kraịst. Nke ahụ bụ ọtụtụ mmadụ!

Akụkọ a dị n'akwụkwọ Ọrụ Ndịozi nwere ike bụrụ ebe ọ malitere maka mba a niile - nke Filip, ezipuru Filip ikwusa Oziọma. E duuru ya gaa na nke otu nwoke ọ na-ahụtụbeghị, bụ nke na-agu Akwụkwọ Nsọ mana ọ maghị ihe ọ na-agụ. Filip zara ajụjụ ya, bụ́ nke gbanwere ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi ma gbanwekwazie akụkọ ihe mere eme nke ǹdé mmadụ ndị ọzọ n’obodo ya dị ka esi gosi taa.

Mee ka ọ bụrụ ọrụ gị ịmatakwu Jizọs. Rịọ Chineke ka ọ mụbaa ịhụnanya gị maka Okwu Ya. Jụọ ajụjụ nkwuwa okwu gbasara okwukwe na mkparịta ụka gị na ndị ọzọ. Bụrụ onye Jizọs na-edu bụ onye a ma ama maka ịgbasa ozi ọma n’oge ọbụla.

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iji Ntụkwasị Obi Ekekọrịta Jizọs

Atụmatụ ogugu maka ụbọchị ise a ga-enye gị amamihe na nkwuwa okwu iji kesaa Jizọs. Bụrụ ìhè n'ọchịchịrị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Willie Robertson maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.harpercollins.com/blogs/authors/willie-robertson