Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iji Ntụkwasị Obi Ekekọrịta JizọsIhe Atụ

Iji Ntụkwasị Obi Ekekọrịta Jizọs

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Obisiike ịkekọrịta

Nṅomi abụghị naanị ụdị otito na-ezighie ezi kama ọ bụ etú e si emezuputa ọtụtụ echiche buru ibu. Mgbe anyị hụrụ ka ndị ọzọ mere nnukwu ihe, anyị agbalịa ime otu ihe ahụ. A bịa n’ihe banyere mmekọrịta anyị na Jizọs, ọ dịghị iche. N’ezie, Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na anyị kwesịrị inwe ụdị echiche ahụ Jizọs nwere. Iso Jizọs na-aghọ karịa okwu ọnụ - ọ bụ etú anyị si ebi ndụ anyị.

Ọ bụrụ na anyị kwesịrị ibi ndụ etú Jizọs si bie ndụ, kedụzi etú o si bie ndụ?

Ọ bụghị naanị na ọ bụ ezigbo mmadụ na nnukwu agbataobi nke gbara mbọ ije ụka oge ọbụla O nwere ike. Ihe pụtara ìhè bụ etú o si eme Nna ya obi ụtọ ma na-elekọta ndị mmadụ anya nke ukwuu. Ọ gbadoro anya karịsịa ná ndị furu efu bụ ndị na-enweghị okwukwe n’ihe ọbụla karịrị ihe ha pụrụ ịhụ anya n’ụwa a.

Jizọs nwere obi maka ndị furu efu, ya bụ, iji bie ndụ ka Ya, anyị ga-enwerịrị otu obi ahụ.

Ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu - nke bụ ihe Jizọs bịara ime na ihe a kpọrọ anyị ka anyị mee - gụnyere ịdị na-agba mbo agakwuru ndị furu efu. Ọ dị mfe ịhụ ndị furu efu gburugburu anyị; ọ bụ ihe ịma aka ịchọ ha, etú Jizọs si mee ya.

Chee maka ịchọ igodo ụgbọala gị furu efu maọbụ obere akpa gị. Nke a bụ ebe ịchọ ihe na-aghọ ihe kacha anyị mkpa. Ihe ndị ọzọ niile na-akwụsị mgbe anyị na-achọ ihe ndị a n'ihi na, maka ọtụtụ n'ime anyị, ndụ na-akwụsị maka anyị mgbe anyị na-enweghị ha. Ọtụtụ mgbe, ma obere akpa na igodo ụgbọala m na-efunarị m. I jighị ego maọbụ kaadị ụlọakụ, ị gaghi enwe ike izu ihe ọbụla.

Ụbọchị ndị a, ịchọ ekwentị furu efu na-aghọ ozi pụrụ iche! Ọ na-eme gị ịhụ ya ngwa ngwa n'ihi na ị nweghị ike ị che n'echiche etu ụbọchị gị ga-esi aga ma ị jighị ya. Ị ga-echeghachi echiche azu n'ije obula i gara na-enyocha nke obula. Ọtụtụ ngwaọrụ ga-eneyere gị aka ịchọta ya dịkwa n’ekwentị ahụ. Ị na-achọkarị ndị mmadụ ka ha nyere gị aka ịchọta ya, mana ị gaghị enwe ike ịkpọ ha. E nwere ike, ọ nwebughị mgbe ị bu akara ekwentị ha n'isi. Yabụ, ị ga-achọkwa ha.

Taa, olileanya m bụ na anyị, dịka Nzukọ nsọ, ga-etinyegharị anya n’okwu Jizọs ma were ozi Ya ịchọ ma zọpụta ndị furu efu ka anyị na-ebi ndụ ihe o nyere anyị ka anyị mee. Anyị enweghị ike ime nke a n'esoghi ezi usoro, kama mara ụma, dị ka ịchọ ekwentị furu efu.

Ekpere m bụ ka ị nwee obi ike n'ịkesa okwukwe gị mgbe ị gụchara maka aka a m na-ama gi n’ihu. Olileanya m ọzọ bụ na ịkekọrịta Jizọs ga-abụ ozi na-akọwa gị dịka mmadụ. Enwere ọtụtụ ndị furu efu n'iro ebe ahụ, yabụ ka anyị gaa! Ka anyị malite ịchọ na ịkọrọ ha akụkọ banyere Jizọs Kraịst, onye naanị Ya pụrụ ịzọpụta ha!

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iji Ntụkwasị Obi Ekekọrịta Jizọs

Atụmatụ ogugu maka ụbọchị ise a ga-enye gị amamihe na nkwuwa okwu iji kesaa Jizọs. Bụrụ ìhè n'ọchịchịrị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Willie Robertson maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.harpercollins.com/blogs/authors/willie-robertson