Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iji Ntụkwasị Obi Ekekọrịta JizọsIhe Atụ

Iji Ntụkwasị Obi Ekekọrịta Jizọs

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Obisiike Ịmalite

Dịka onye na-eso ụzọ Jizọs, ọ na-amasị m ịdị njikere na nkwadobe mgbe m nwere ohere ịkọwa olileanya m nwere n'ime Ya. Tụkwasị m obi, ọ bụghị iwu na Ị ga-abụ ọkà mmụta Bible. Abụ m n'ezie. Ebe e kwugooro nke ahụ, ịhụ Okwu Chineke n'anya ga-enyere gị aka n'ezie mgbe ị na-agakwuru ndị mmadụ. Akwụkwọ Nsọ jupụtara n'akụkọ banyere mkparịta ụka dị n'etiti ndị mmadụ. Igosi ndị mmadụ Akwụkwọ Nsọ ga-edubata ma jikọọ ha na Okwu Chineke ka ha wee malite iji ya mee ihe dị ka ihe nduzi ha ná ndụ.

Ọtụtụ mgbe, tupu m amalite ịgụrụ mmadụ akụkọ sitere n’Akwụkwọ Nsọ, ana m na-achọ ibu ụzọ nụ akụkọ onye ahụ. Ọ dị mfe isonye ma ghota akụkọ mmadụ n'ihi na anyị niile nwere otu. Achọpụtara m na nke ahụ bụ ebe kacha mma i si malite. Ịwere akụkọ tinyere akụkọ abụghị ihe a na-eme oge ekpemekpe maọbụ ihe nwere ka ọ dị, maka na anyị na-ekerịta akụkọ anyị kwa ụbọchị mgbe ọbụla, na ebe ọbụla ndị mmadụ na-akparịkọta. Ka ị na-etinyekwu uche gi n’ozi gị, ị chọrọ ka akụkọ gị na-eduga na akụkọ Chineke.

Gịnị bụ ebumnobi gị maka ige mmadụ ntị? Olileanya bụ na ọ bụ n'ihi na ihe banyere onye ahụ na-emetụta gị, ọ bụkwa etú ahụ kà Jizọs si elekọta ndị ọzọ. Ọ bịara ịchọ na ịzọpụta. Nlekọta bụ ebe njem ahụ na-amalite. Mgbe ihe banyere ndị ọzọ kwụsịrị ịmetụta anyị, maọbụ anyị na-elekota naanị ụfọdụ ndị, ozi Jizọs efunahụ anyị. N'ụbọchị ndụ anyị ga-abịa n’isi njedebe, ọ ga-abụ ndị ihe jikọrọ anyị na ha, nakwa ndị ndụ anyị meturu ga-abụ ndị ga-akacha apụta ìhè. A na-ekpughekarị eziokwu ahụ mgbe a na-aga ụka olili ozu mmadụ. Ihe a na-ekwu, ihe a na-ekwughị, na onye bịara iru újú na ịkwanye ùgwù na-egosi ụdị ndụ mmadụ biri.

Anyị niile nwere akụkọ njem nke nke anyị na ndụ a. Ụfọdụ akụkọ ndụ dị ukwuu, ebe ndị ọzọ adịchaghị ukwuu. Nke gị nwere magbuo onwe ya, na-atọ ụtọ, maọbụ ọ nwee ike bụrụ nke dị mwute nke nwere ọtụtụ ihe mmebi maọbụ mkpebi ọjọọ. Ma eleghị anya, ọ bụrụ nke nwere ụfọdụ n'ime ihe abụọ ndịa. Ma ị gaghị enwe ike ịmata akụkọ ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ị jụghị ha.

N'ihi nke ahụ, ịjụ ajụjụ bụ ntọala ebe ị ga-amalite ịkesa okwukwe gị. Ajụjụ ndị dị mfe dị ka, ‘Olee ebe i si?’ maọbụ ‘Ì nwere ezinaụlọ?’ maọbụ 'Olee etú ịzu ụka gi na-adịkarị?’ bụ ụfọdụ ajụjụ ndị anyị niile na-ajụkari iji malite mkparita uka n’etiti anyị na onye ọhụrụ.ụka. Achọpụtara m na ịjụ ajụjụ dị nnọọ mfe, ọ na-edugakwa n'eziokwu. Nke a bụ ebe nkwadebe anyị na-abịa inyere anyị aka ịza onye ọbụla na-ajụ anyị ihe kpatara olileanya ahụ anyị nwere. Ụzọ a bụ ihe kewara mkparịta ụka a na-enwe kwa ụbọchị na mkparịtauka ama ụma na mkparịta ụka nke gbadoro ụkwụ na ozi ọma.

Ọ bụrụ na anyị na-agbalị ịchọpụta ma mmadụ na Onye nwe anyị enwere mmekọrịta, anyị kwesịrị ịma etu mmekọrịta ahụ si arụ ọrụ. Ka anyị malite site n’ileba anya n’etu e si emeputa mmekọrịta anyị na ndị mmadụ na etu ha pụrụ isi na-adịwanye mma.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Iji Ntụkwasị Obi Ekekọrịta Jizọs

Atụmatụ ogugu maka ụbọchị ise a ga-enye gị amamihe na nkwuwa okwu iji kesaa Jizọs. Bụrụ ìhè n'ọchịchịrị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Willie Robertson maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.harpercollins.com/blogs/authors/willie-robertson