Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Afọ Atúmanya Gị Mezurù: Ụbọchị Ise Nke Inweta Mkpali Iji Malite Afọ Ọhụrụ Gị N'ụzọ Dị IkeIhe Atụ

Your Breakthrough Year: 5 Days of Inspiration to Kickstart Your New Year

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

ỤBỌCHỊ NKE ANỌ – AKỤKỤ B NKE NDỤ

Oge ugbu a, anyị n'ege egwú siteré na foonu anyị jirí ihe ndị ana akpọ earbuds. Ihe niile bụzi dijitalụ. Tupu oge a, ana enwebú ihe ndị ana akpọ cassette tapes, 8 tracks na vinyl records. Mana naanị records nwerè ụdị rekọding karịrị otu.

O nwerè ike ịbụ na afọ gị erughị ka ị cheta mgbe rekọd gasị nọ na 45s. N'ime afọ digital a, o nwerè ike isi ike ikwenye na o nwerè mgbe a pụrụ igote rekọd gasị dị obere nweré naanị egwú abụọ na ha. Otu egwú dị na side A ma egwú nke ọzọ adị na side B.

Otu album nwerè ike inwe egwú iri ma ọ bụ iri na abụọ na 33 ma ọ bụ na rekọd apụrụ ịkpọ ogologo oge, mana rekọd otu mkpụrụ egwú kà ana ere dịka 45. A pụrụ ịkpọ ụdị rekọd abụọ ndị ahụ na turntable, mana adapter ga-adị gị mkpa maka nke 45 n'ihi na ohere ya karịrị nha album.

Egwú nke ụlọ n'emepụta egwú cherè ga-amụta nnukwu ego n'anọ na side A ma nke ahụ nọ na side B bụ nke ahụrụ ka egwú na-abaghị uru. Mana mgbe ụfọdụ, egwú ahụ nọ na side B bụ̀ nke n'emecha bụrụ nke ama ama, n'amụtakwa nnukwu ego.

Ụfọdụ egwú ndị anyị mà ama taa bụ ndị a hapụrụ na "side B". "I saw her standing there" nke ndị Beatles gụrụ, "We will rock you" nke Queen gụrụ, "Hound Dog" nke Elvis Presley gụrụ, "Super Freak" nke Rick James gụrụ, na "You Can't Always Get What You Want" nke Rolling Stones gụrụ.

Ọrụ Ndịozi 16: 6–7 na-agwa anyị si, “Pọl na ndị enyi ya merè njem site na Firjia na Galeshia, mana Mmụọ Nsọ ekweghị ha ka ha zie Oziọma na Eshia. Mgbe ha rutere na Mishia, ha gbalịrị ịga Bìtíniá mana Mmụọ nke Jizọs ekweghị ka ha mee otù ahụ."

Chineke kwụsịrị side A Pọl nke o cherè ga-aga nke ọma, o wee gaa na side B bụ Masedonia. Mana ihe nke a gbanwerè akụkọ ihe mere eme. Oziọma Kraịst sì na Eshia wee bazuó Yurop. E guzoberè òsìsò ụzọ Kraịst na Yurop, o wee si na Yurop gbasaa n'ụwa niile.

Ihe nke apụghị ime ma ọ bụrụ na Pọl ejighị obi ya dum nakweré mgbanwe gasị merenụ n'atụmatụ ya ndị ahụ. O nwerè nhọrọ nke iwesará Chineke iwe ma ọ bụ ike onwe ya agwụ ya. O nwerè nhọrọ nke iji obi ọjọọ gaa Yurop wee rụọ ọrụ ejighị obi ya niile. Mana kama nke a, o guzoberè ụka Kraịst n'ọtụtụ ebe na obodo.

Ị nwerè ike ịnọ n'otu ọnọdụ ahụ Pọl nọbù. Ọ bụ ezigbote ngbanwe n'ihe i bù n'obi i chọrọ ime. Mana Chineke pụrụ iji yabụ ihe weta ọganihu ká ukwuu na mmetụta sara ụwa karịa ka ị pụrụ ichetù n'echiche.

Ị pụghị ịma ihe Chineke pụrụ iji side B gị eme.

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Your Breakthrough Year: 5 Days of Inspiration to Kickstart Your New Year

Afọ ọhụrụ pụrụ ịbụ afọ ị nwetara ihe ndị ahụ ị n'atụ anya ya. Ihe ndị ahụ i n'atụ anya ha nọ n'akụkụ nke ihe mgbochi ma ọ bụ nsogbu ahụ i cherè ihu afọ gara aga. Afọ a pụrụ ịbụ afọ ị ga-enweta ezigbo ihe oma ahụ ị tụrụ anya kemgbe maka ndụ gị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a ga-ekekọritara gị mgbamume na mkpali nke ime mmụọ dị mkpa ka ị nweta iji nwee afọ kachasị dị nma i nweturulà.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Fedd Agency maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.rickmcdaniel.com/thisisliving.html