Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Afọ Atúmanya Gị Mezurù: Ụbọchị Ise Nke Inweta Mkpali Iji Malite Afọ Ọhụrụ Gị N'ụzọ Dị IkeIhe Atụ

Your Breakthrough Year: 5 Days of Inspiration to Kickstart Your New Year

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

ỤBỌCHỊ NKE ABỤỌ – IHE N'EMETUBEGHỊ MBỤ MERENỤ

Otu nwaanyị bi na Ingland tụụrụ ime mgbe o bù afo ime, nke mere ka ọ mụọ ụmụ ejima a tụụrụ ime ha n'ohere izu ụka atọ! Dị ka ama ama, mgbe nwaanyị tụụrụ ime, ahụ ya na-amalite usoro gasị ga-egbochi atụtụ́ ime ọzọ n'oge ahụ, gụnyere iwepụta ihe ndị ana akpọ hormones iji gbochie ihe ana akpọ ovulation.

Nke n'eme mana ọ dị ụkọ, bụ na nwanyị dị ime nwere ike iká n'eme ovulate ma sperm pụrụ imetụ àkwá ya ahụ o wee tapanyé n'ime uterus. Ihe a n'emenụ́ dị ịtụnanyá, ebe àkwá abụọ sperm metụrụ tapanyerè n'ime uterus n'oge dị iche iche ka ana-akpọ superfetation.

Na izu iri na abụọ ndị dọkịta, mgbe ha merè ultrasound, chọtara nwa nke abụọ ji izu ụka atọ dị ichè n'ibu tụnyere nwa nke mbụ. N'ihi na superfetation bụ ihe n'adịghị eme oge niile, ndị dọkịta apụghị ikọwa na mbụ ọdịiche na nha ha hụrụ n'etiti nwa abụọ ndị ahụ. Ndị dọkịta mecharà kpọọ ihe ahụ ha chọpụtara superfetation.

Ụmụ ndị ahụ, Noah na Rosalie, ka a mụrụ mgbe oge ọmụmụ ha n'erubeghị. Noah nọrọ izu atọ n'ụlọ ọgwụ ma Rosalie anọọ izu ụka iri na atọ n'ime ụlọ ọgwụ. Mana ha abụọ nọ n'ụlọ ha ugbu a n'udo.

Superfetation bụ ihe ana adịghị ahụ oge niile n'ihi na ihe atọ dị iche, dị ịtụnanya ga-emeriri ka ọ bịa na mmezu. Ovulation, nke hormone gasị afọ ime na-akwụsị, sperm imetu àkwá, nke na-akwụsị mgbe nwaanyị tụụrụ ime n'ihi na ihe mgbochi mukọs ga-apụta wee kwụsị sperm ka ọ ghara isi na cervix gafee, na ntapanyé, nke chọrọ ohere zuru okè ka embryo ọzọ dị n'ime otu uterus ahụ, na hormone gasị dị mkpa ịpụta n'arụ ọrụ, ana ekwesịghị ihu ozugbo nwaanyị dị ime.

Mana ihe ndị ahụ niile merè ma Rebecca Roberts n'afọ 39 ya tụụrụ ime wee mụọ ejima.

O nwere oge gasị mgbe Chineke n'eme ka ihe ndị n'emé na ọnọdụ gasị kwekọọ ọnụ iji mepụta ihe dị ịrịba ama. Anyị nwerè ike ghara ịhụ otù ọnọdụ ahụ pụrụ isi wee dị mma, anyị nwerè ike ina eche ka ihe ga-esi dị nma karịa ka anya anyị n'ahụ, anyị nwekwarà ike ina eche na ngwọta adịghị ma ọlị.

Mana mgbe anyị n'eche otu a, Chineke n'eme ihe ana ahụtụbeghị mbụ, ihe dị ụkọ, ihe pụrụ iche. Ọ na-eme ka ihe ndị n'emenụ kwekọọ ọnụ n'ụzọ zuru okè ka ihe ndị n'ekweghị omume kwe omume. Chineke na-arụ ọrụ site n'ike nke Mmụọ Nsọ.

Mgbe anyị n'emeghe onwe anyị hapụrụ Chineke, Mmụọ Nsọ n'eji ike wee n'arụ ọrụ n'ime anyị ma anyị ga-ahụkwa ike ọrụ okike Ya. Ọ ga-eduzi ndụ anyị; Anyị pụrụ izu ike na ntụziaka Ya. Anyị ga-ejikwa anya anyị abụọ hụ ihe ndị dị ịrịba ama Ọ ga-eme.

Jizọs kwuru na Jọn 14:26 "Mana Mmụọ Nsọ ga-abịa wee nyere unu aka n'ihi na Nna M ga-ezite Ya ka Ọ bịa nọnyere unu n'ọnọdụ M." Site n'ịrụ ọrụ nke Mmụọ Nsọ, anyị ga-enwe ahụmahụ gasị nke ihe ndị n'emé n'enyeré anyị aka na ndị anyị pụrụ naanị ịghọta na ha si n'aka Chineke.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Your Breakthrough Year: 5 Days of Inspiration to Kickstart Your New Year

Afọ ọhụrụ pụrụ ịbụ afọ ị nwetara ihe ndị ahụ ị n'atụ anya ya. Ihe ndị ahụ i n'atụ anya ha nọ n'akụkụ nke ihe mgbochi ma ọ bụ nsogbu ahụ i cherè ihu afọ gara aga. Afọ a pụrụ ịbụ afọ ị ga-enweta ezigbo ihe oma ahụ ị tụrụ anya kemgbe maka ndụ gị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a ga-ekekọritara gị mgbamume na mkpali nke ime mmụọ dị mkpa ka ị nweta iji nwee afọ kachasị dị nma i nweturulà.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Fedd Agency maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.rickmcdaniel.com/thisisliving.html