Afọ Atúmanya Gị Mezurù: Ụbọchị Ise Nke Inweta Mkpali Iji Malite Afọ Ọhụrụ Gị N'ụzọ Dị IkeIhe Atụ

ỤBỌCHỊ NKE ATỌ – ỊDỊ NTỌHAPỤ́ N'AGBỤ́
Enwerè m ihe ùgwù nke ịga hụ nnukwu obodo Filipaị dị na Gris. Nke a bụ ebe Pọl onyeozi hiwerè ụlọ ụka Ndị n'eso ụzọ Kraịst mbụ na Yurop. Ọ bụkwa ebe a kà e nwerè onye mbụ ghọrọ onye n'eso ụzọ Kraịst na Yurop. Aha ya bụ Lidia ma a zọpụtara ya wee mee ya baptizịm. A gakwarà m ga hụ ebe e mere ya baptizịm na Osimiri Gangites.
Pọl bịara Filipaị ugboro abụọ gụnyeré ọbịbịa ya ndị ọzọ. O si Rom degaara nzukọ ha akwụkwọ anyị na-akpọ Ndị Filipaị. Akwụkwọ a nwerè ụfọdụ amaokwu ama ama na Akwụkwọ Nsọ (1:6, 2:5-11, 3:12-14, 4:13). Obi ụtọ Pọl nwerè n'ebe Nzukọ Ndị Filipaị nọ pụtara ìhè n'akwụkwọ ozi ya ebe ọ gbara ha ume ka ha n'ebi ndụ dịka Ndị Kraịst n'enwe mmeri.
Ọ bụkwa na Filipaị ka e tirì Pọl na Sailas ihe wee tụba ha na mkpọrọ. Ahụrụ m ụlọ nga ahụ ebe a tụrụ ha mkpọrọ. Pọl ji aha Jizọs chụpụ mmụọ igba afa dị n'ime otu nwaada. Mgbe ndị nwe ya chọpụtara na ha apụghịzi iji ya wee na-akpa ego, ha dọkpụrụla Pọl na Sailas gaa tugide ha asị n'ihu ndị ọchịchị, na-asị na ha bụ ndị n'enye nsogbu.
N'etiti abalị Pọl na Saịlas nọ n'ekpe ekpere ma n'abụ abụ mgbe, ka Ọrụ Ndịozi kwuru si, "Ozugbo e nwerè ala ọma jijiji nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ tibìsichaá: ozugbo ozugbo ụzọ mkpọrọ niile dị n'ime ụlọ nga ahụ meghecharà ma ọgbụ́ ndị niile nọ ebe ahụ tọghapụcharà." Obere ala ọma jijiji merè nnọọ ebe ahụ kpọmkwem. Ike Chineke sì na ụlọ nga lụhapụ ha!
Mgbe nke a merè, onye n'elekọta ndị ahụ niile a tụrụ mkpọrọ mipụtara mma ya ka o gbuo onwe ya n'ihi na ndị ahụ niile ọ n'eledo ga-agbapụsichá. Mana Pọl kwụsịrị ya ime otù ahụ, o wee jụọ Pọl, "Gịnị ka m ga-eme ka e wee zọpụta m?" Pọl zara ya si, "Kwèré na Onye-nwe-anyị Jizọs, aga azọpụta gị."
Otu ike nke Chineke ahụ dị adị taa maka onye ọbụla chọrọ ya. A kà na-azọpụta ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ. Ka m gwa gị, e nwerè nnukwu ọganihu n'emenụ nke ịzụ na ịkwado ụmụ nwoke nọ na mkpọrọ ka ha bụrụ ndị ozizi Kraịst.
Chineke kà sì n'agbú ama ama ma nke ana amaghị ama atọhapụ ndị mmadụ. Taa, ọtụtụ ndị nwerè ihe gasị n'eri ahụ ka ji ha n'ọbù. O nwerè ike ịbụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ iri ọgwụ n'ụzọ n'ekwesịghị ekwesị. O nwerè ike ịbụ ikiri ndị n'agba ọtọ oge niile ma ọ bụ imefu ego n'ụzọ gabigará okè. Ihe ọbụla ọ bụ, Chineke dị ike isi na ya tọhapụ gị. Ama m ọtụtụ akụkọ banyere mgbe a zọpụtara ndị mmadụ kà Chineke si anapụta ha ozugbo n'agbụ ha.
Ike nke Chineke dị adị. Ọ dịkwa adị nye mmadụ niile. Ọ bụrụgodi na ị nọrọla ọtụtụ afọ n'agbụ, Chineke dị ike ime gị ka i nwere onwe gị. Chineke pụrụ imeere gị ihe O meerè Pọl na Sailas.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Afọ ọhụrụ pụrụ ịbụ afọ ị nwetara ihe ndị ahụ ị n'atụ anya ya. Ihe ndị ahụ i n'atụ anya ha nọ n'akụkụ nke ihe mgbochi ma ọ bụ nsogbu ahụ i cherè ihu afọ gara aga. Afọ a pụrụ ịbụ afọ ị ga-enweta ezigbo ihe oma ahụ ị tụrụ anya kemgbe maka ndụ gị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a ga-ekekọritara gị mgbamume na mkpali nke ime mmụọ dị mkpa ka ị nweta iji nwee afọ kachasị dị nma i nweturulà.
More