Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Niile M ChọrọIhe Nhụchatụ

Everything I Need

ỤBỌCHỊ 3 NKE 3

Ọtụtụ mgbe, mgbe m cherè na m na-achọsi ihe ike, ma ọ bụ chọọ ihe ọhụrụ ná ndụ m, ihe na-agụsi m agụụ ike n'ezie bụ ọnụnọ Chineke, olu Chineke, na Okwu Chineke. Ebe ọbụla Ọ batara, ụjọ na-agba ọsọ karịa obere ngwere ndị m n'ahụ ka m n'eje ije n'okporo ụzọ South Florida, udo na-alodata dị ka blanketị n'ekpo ọkụ eji awuchi ahụ ụbọchị sno na-adà, ma ebumnobi gasị ewee n'atụli elu ma n'agba egwú jiri obi ụtọ ọhụrụ.

Nrọ na atụmatụ na ebumnobi gasị anyị n'amaghịdị na ha dị n'ime obi anyị.

N'ọnịnọ Ya, anyị na-arọ nrọ n'ụzọ ọhụrụ gasị. Obi anyị na Ya n'ekwekọrịta n'ihi na O bi n'ime anyị wee n'agbanwe anyị site n'ime ruo na mpụta. Anyị na-achọta nzube site n’Eziokwu nke Okwu Ya. N'ọnịnọ Ya, ihe ọ bụla anyị sí dị anyị oké mkpa n'ejubiga oké oke n'akụkụ niile nke ndụ anyị. Site na oké ụba ahụ anyị n'eso Nna-ukwu Onye Okike wee n'eke ihe, Nna-ukwu Onye Okike esikwa na anyị wee n'eke ihe.

Mgbe niile na ruo mgbe ebighị ebi ka Ọ nọ n'ọrụ n'emepụta ihe ọhụrụ site n'ebe ochie na ebe kpọnwụrụ akpọnwụ n'ime ndụ gị. Chineke adịghị naanị agbanwe ọnọdụ gị na ọgụ gị gasị, Ọ n'edekwa akụkọ ỌHỤRỤ, ncheta Ọhụrụ, na njem ỌHỤRỤ GASỊ maka gị.

Ọnịnọ Chineke n'eme ka ihe gbajiri agbaji na nke tiwasirí etiwasí zuo oke. Nke a abụghị n'ihi ihe ọ bụla anyị meworo, kama ọ bụ n'ihi na O zuru okè. Ọ dịghị ihe ọbụla n'ime Ya dị mgbaji ma ọ bụ dị ntiwa; Ọ dịghị akụkụ ọbụla n'ime Ya nwere nsogbu ma ọ bụ mebie emebi. O nweghị akụkụ Ya ọbụla dị nkewa ma ọ bụ gbajipú agbajipú; O nweghị ọnyá n'akụkụ Ya ọbụla ma ọ bụ nwe nkwarụ. O merughị ahụ ebe ọbụla n'ahu Ya; O zuru okè. O nweghi ihe mgbu ma ọ bụ ihe nwute. O zuru òkè n'ihe niile.

Ma site na Jizọs Kraịst, anyị onwe-anyi zukwara òkè. A n'eme anyị ka anyị dị ọhụrụ n'ọnịnọ Ya.

O nweghị ihe dị ka ibasị-ike n'ime ọnụnọ Ya n'ichuso òkè anyị site na Ya. O nweghị ihe dị ka ịchụso Onye bụ́ Ya na-enye ihe.

N'achụso Onye na-enye gị ihe site n'ọtụtọ & ekele, jiri òfùfè, na ezi-okwu nke Okwu Ya.

Emekwala nchuso a naanị gị, ọbụlagodi mgbe o nwerè kà ọ dị ma ọ bụ na ihere n'eme gị. Lusò mmasị ahụ ọgụ chọrọ ijigide gị ka ị gaa rapara n'oche ụlọ gị wee nọrọ naanị gị (ma ọ bụ jiri Netflix na-abaghị uru wee n'enweta onwe gị). Ebe ọbụla mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa zukọrọ n’aha Ya, Chineke ekwewo nkwa na Ya ga-anọ ebe ahu. Ahụla m ọrụ ebube dị ịtụnanya emerè n’ime obi na ahụ nke ndị na-achokó ihu Chineke ọnụ… Ahuwó kwa m ha n'ime ndụ mụ onwe m. Banye n'ime ọgbakọ na nnọkọ ndị nke Kraịst ma nọrọ n'ime nnọkọ na ọgbakọ a. Ọ bụ otú e si mee ka anyị wee n'etọ.

Kwụputa ma mee ka ntị nụ na ọ bụ Chineke n'achi n'oge ihe ọma ma n'oge ihe ọjọọ, n'oge ọkọchị ma n'oge imi mkpụrụ niile, na n'oge ezumike adịghị na n'oge nke izu ike. Ọ chọrọ ịnụ ka anyị na-ekwusà eziokwu Ya, n’ihi na eziokwu Ya dị mma ma sie ike. Mgbe anyị na-ekwu eziokwu Ya, anyị na-achota ọṅụ ma burukwa ndị nwere obi ekele. Ọ chọrọ ekele anyị, ọtụtọ anyị, na òfùfè anyị n'ihi na Ọ maara na nke ahụ ga-echetara anyị na Ọ nọ n'ocheeze, na O burugorị̀ ụzọ gaa n'ihu ihe ọbụla anyị n'eche ihu ụbọchị taa.

Obi m n'eti maka gị, gị bụ onye na-agụ okwu ndị a. Karịa ihe ọ bụla, achọrọ m ka ị mara Ya, na otú O si dị mma. Ọ dịghị ahapụ anyị e nyeghị enyemaka ọbụla, Ọ naghị agbachi nkịtị n'ele anyị ka anyị n'atá ahụhụ nke ndụ ma ọ bụ ghara ịsetịpụ aka ebere Ya n'ebe anyị nọ ma anyị rịọ Ya ihe.

O kwere anyị nkwa na anyị chọọ Ya, anyị ga-achọta Ya. N'agbanyeghị ebe obula anyị nọ, na otu anyị siri ruo ebe ahụ, Chineke nwere òkè zuru okè n'echeré anyị.

Ekpere Mmechi na Ntụgharị Uche

Chineke, onyinye ọ bụla dị mma na nke zuru òkè n'esi n'aka Gị abịa, anyị apụghịkwa iji obi ma ọ bụ uche mara ihe Ị kwadeberè maka anyị n'ọdịnihu..., mana anyị ma na Ị chekwaalarị̀ ya, kwụọ ugwo ya, ma dowerì ụzọ anyị isi nwete ya.

Chineke, anyị chọrọ ịnọ ebe Ị nọ. Anyị chọrọ ịhụ ihu Gị, ịnụ olu Gị, ịnọ n’ezie n'ihu ihunanya nke zuru òkè. Ịhụnanya n'enweghi mmerụ. Ịhụnanya dị ọcha dị ka mkpu-ákwá nwa a mụrụ ọhụrụ.

Bịa zute onye n'agụ edide a ebe ọ nọ ugbu a, n'ihi na ị maara onye a nke ọma. Ị ma ndoli, ọgụ̀, ọdịdà, na ugwú gasị onye a na-alụso ogu. Ị maara ihe dị mkpa iji wee mmeri ihe ndị a, ma Ị nwetalarị ya. Karịa onyinye mara mma gasị nke Ị n'ewetara anyị niile, wetara onye n'agụ ihe a ọninọ Gị, ugbu a.

N'ime obi ima jijiji, n'ime ọchịchịrị, n'ime agha, n'ime ọzara, anyị agaghị akwụsị ito Gị, ife Gị òfùfè, itikụ̀ Gị, itụkwasị Gị obi, iweda onwe anyị ala n'ebe Ị nọ, na ichetà otú Ị siri kpọta anyị ebe a site n'ikwesị ntụkwasị obi Gị.

Anyị ji atumanya n'echeré Gị, Onye-nwe-anyị. Ị bụ òkè anyị zuru okè. Ị bụ ihe niile anyị chọrọ.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Everything I Need

Chineke agawori n'ihu anyị ma sikwa n'azụ n'echebe anyị. Agha anyị niile bụ nke Ọ luchagorò. O kpuchigorì ebe ọbụla dị oghe nke ndụ anyị. Ọ dịghị ihe ọ bụla gbasara anyị na-adị Ya ka ihe ọhụrụ. Ihe ofufè nke ụbọchị ato a akpachara anya mee, ga-eme ka ị dị mgbamume n'ime eziokwu bụ na Chineke bụ Onye n'enye okè kpọmkwem, nha kpọmkwem, maka ndụ gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Holly Magnuson maka iwete Atumatu Ihe Ọgụgụ a. Maka ọzi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.hollymagnusonco.com