Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Niile M ChọrọIhe Nhụchatụ

Everything I Need

ỤBỌCHỊ 1 NKE 3

Ihe Niile M Chọrọ: Òkè M


“Gịnị mere m ga-eji nwee nkụda mmụọ, gịnị kpatara ihe ndị ahụ n'enye mmụọ m nsogbu ga-eji bịa,
Gịnị mere owụwụ ga eji maa obi m, eluigwe na ebe m ga-anọ dị jụụ ana-agusi m aguu ike;
Mgbe Jizọs bụ òkè m, enyi m n'adịghị agharipụ́ m ka Ọ bụ.
Anya Ya dị na nwa nza, amakwa m na Ọ n'eledo m anya.
Ana m agụ egwú n'ihi na obi dị m ụtọ, na agụ egwú n'ihi na enwerela m onwe m.
Anya Ya dị na nwa nza, amakwa m na O bù m n'obi.”
-Civilla D. Martin, 1905


Amaghị m banyere gị, mana okwu ahụ òkè aburula ihe emebiworo m rụọ ebighi ebi site na mgbasa-ozi-ahia nke Weight Watcher dị iche iche e merè ka ndị mmadụ kirie ọtụtụ oge, ihe gafere afọ iri. Òkè = nri. Òkè = nri ahaziri ahazi. Òkè na-arụtụ m aka na ndụ nke iri ihe nwa obere nwa obere, nke igonahu onwe m ihe ụfọdụ. Ọ pụtara ijidesị onwe m ike, ekweghị ka onwe m rachaa Moose Tracks ais krim jupụtara na nnukwu efere ka m wee nwee obi ụtọ, ma ọ bụ ịkwụsị ita chokoleti lava keeki tọgburu onwe ya, mgbe m tabitụrụ nwa obere na ya. Òkè pụtara iri ma ọbụ irachatu nwa obere ihe ahụ na-agụsi m agụụ ike. Ọ pụtara na m ga-akwụsịtu inara ma ọ bụ inwe ihe m chọrọ n'ezie, nke ga-apụta na n'ikpeazụ, afọ agaghị eju m.

M si “òkè,” gị za m sị… Njikwa!

M na-eche ma ọ bụ̀ otu ahụ ka Civilla Martin si chee echiche banyere okwu ahụ bụ òkè mgbe ọ dere ọmarịcha abụ ahu banyere otu di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst, ndị n'agbanyeghị na ha nwere nkwarụ na ọrịa dị iche iche nke anụ ahụ, birì ndụ aṅụrị jupụtara ná okwukwe? (Lee akụkọ banyere egwú ahu ka ihu ụfọdụ ihe na-akpali mmasị!) Eji m n'aka na ọ naghị eche maka nkwụsịtụ, dị ka anyị n'eche banyere ịkwụsịtụ iri shuga ma ọ bụ carbs n'oge a. Nri ndị ahụ ahaziri ahazi na echiche obi nke ijikwa ihe anyị n'etinye n'ọnụ bụ n'ezie, ihe n'etebeghị aka anyị bidoro mewe n'otu anyị si ebi ndụ ugbu a bụ nke imefe ihe okè na iri ihe karịa ka anyị kwesịrị.

Na mmalite nke narị afọ nke iri abụọ, Cheetos na Cinnabon anọghị ya. Enweghịkwanu ihe ana akpọ fast food, ma isi apụl pai rara ezigbo ahụ karịa mfe ọdị m inyawà bọxù Pillsbury pai krụstụ, wepụta krụstụ ahụ emegoro eme, ma gbụpụta nha mara mma gasị na ya, wee tinye ha n'elu pai m. N’anya uche m, apụl pai emere n’ụlọ n'oge 1905 bụ n’ezie ihe ahụrụ uru na ya karịa, nke ndị ezinụlọ na ndị enyi nọ n’obodo n'erikọ ọnụ na tebụl, karịa ka anyị n'eche banyere otu esi eri apụl pai taa. A sị ka e kwụwe, anyị pụrụ igbapu ọsọ gaa n'ụlọ ahịa ihe nri dị na mpaghara anyị, wee bụrụ otu apụl pai pụta n'ime ihe n'erughị nkeji iri ato!

Okwu a bụ òkè pụtara nhanye n'ezie. Nhanye zuru òkè, a bụghị nhanye n'erughị eru. Nhanye pụrụ iche maka anyị… a bụghị nke onye ọ bụla ọzọ. Ọ bụ òkè kpọmkwem ihe anyị chọrọ. Nkọwa a na-ahụkarị maka òkè (dị ka njirimara aha) bụ "ihe so bụrụ akụkụ nkè ihe onye nwere ma ọ bu ihe ekenyere ya: dị ka nke enweterè site na onyinye ma ọ bụ ihe anatarà site na nketa."

Onyinye , ihe nketa - ihe anyị na-apughị iji ike anyị kpata, bú nsọpụrụ anyị n'enweta naanị site n’ịbụ ndị esi n'ezi wee kpọbata n’ime ezinụlọ nke Chineke dị ka nwa nwoke na nwa nwanyị. Jizọs bụ òkè anyị. Òkè anyị nke ihe dị mma. Ihe nketa nke ezinụlọ-anyị nwéré ihe ùgwù na aha niile rúrú nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị bụ nwa afọ.

Abụ Ọma 16:5 [AMP] na-ekwu, sị: “Onye-nwe-anyị bụ òkè arọpụtara m na nke ekenyere m, iko m; Ọ bụ Gị ji ma n'echekwa òkè m. Akara-gasị nke ndụ adaworo m n'ebe dị ụtọ dị iche iche; ee, enwere m ihe nketa mara mma.” Anyị nwere ezi ihe nketa n’ihi na Chineke dị mma. Anyị nwere òkè, nhanye zuru òkè e kenyere anyị nke n'echekwa anyị, nke na-akwado anyị, nke na-enyere anyị aka ịfefe n'elu ebili mmiri wee n'alụ ọgụ site na ikwesị ntụkwasị obi Ya na ike Ya. Òkè Ya na nhanye Ya maka anyị bụ onyinye zuru òkè nke dị anyị oké mkpa na ndụ a.


Ntụgharị Uche:

  • Mgbe ị n'eche maka okwu a bụ òkè, echiche gị ọ na-abụ na ihe ị nwere zuuru gị, ma ọ bụ na ị nweghị ihe ka ị sị chọọ? Afọ o juru gị? Gịnị kpatara afọ jiri ju gị ma ọ bụ gịnị kpatara afọ jiri o jughị gị? (Ị maara na ọ bụghị maka nri ka m n'ekwu maka ya n'oge a!)
  • Ị̀ jutula Chineke ihe òkè gị pụrụ iche na nhanye gị bụ̀, n'oge ugbu a? Ọ bụrụ na ị mebeghị otu a, were nwa oge jụọ Ya. Rịọ Ya ka Ọ kpughee ihe ọbụla n'anochi ụzọ òkè gị ahu. Nwee mgbamume. Chineke kwesịrị ntụkwasị obi!
Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Everything I Need

Chineke agawori n'ihu anyị ma sikwa n'azụ n'echebe anyị. Agha anyị niile bụ nke Ọ luchagorò. O kpuchigorì ebe ọbụla dị oghe nke ndụ anyị. Ọ dịghị ihe ọ bụla gbasara anyị na-adị Ya ka ihe ọhụrụ. Ihe ofufè nke ụbọchị ato a akpachara anya mee, ga-eme ka ị dị mgbamume n'ime eziokwu bụ na Chineke bụ Onye n'enye okè kpọmkwem, nha kpọmkwem, maka ndụ gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Holly Magnuson maka iwete Atumatu Ihe Ọgụgụ a. Maka ọzi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.hollymagnusonco.com