Ihe Niile M ChọrọIhe Nhụchatụ

N'ihi na Chineke agagorì n'ihu anyị ma sikwa na-azụ wee n'echekwa anyị, Ọ luchagorì agha anyị niile. O kpuchigorì akụkụ nke ndụ anyị ghere oghe. Ọ dịghị ihe ọbụla nke ndụ anyị n'eme Ọ maghị na Ọ ga-eme. Ka anyị na-agbalịsi ike iji mma agha wee n'ebu agha, hapụ Ya na-azụ, ka anyị ga n'enwe ike ogwugwu na ndoli. Ọ gakwara anyị n’ihu wee chekwaara anyị kpọmkwem nhanye nzọpụta dị anyị mkpa. Òkè kpọmkwem nke e mere maka anyị.
Ọ dịghị ihe dị mma n'ezie karịa òkè nke Ọ debere maka ndụ gị, n'ihi na òkè nke Chineke họpụtara bụ maka gị, na naanị gị. Òkè gị ga-enye gị izu oke na ụba, a bụghị maka onye agbata obi gị. N'otu aka ahụ, òkè nke onye agbata obi gị ga-apụ iche nyekwa ya onwe ya, dịka nke gị si diri gị. Ọ bụ na òkè nke Chineke tụrụ na nke zuru òkè maka gị ka ị ga n'eme ihe n'oké aṅụrị, ma dị ndụ n'uju.
Chineke chọrọ inye gị òkè Ya maka ndụ gị. Ọ dịghị eme ọrụ nke igbochi inye onyinye dị nma, Ọ nọ n'ọrụ ime ka ha zụọ oke. Ị riọ Ya maka achịcha, Ọ gaghị enye gị okwute… ya mere meghee ọnụ gị rịọ Ya ihe! Ọ dị Ya ọsịịsọ ka ị bido nwetewe ụtọ nke òkè, nhanye, nke dị ebube na nke pụrụ iche bụ nke gị.
Naanị amalitela ịrịọ Ya ihe site n'echiche nke ibu n'obi ihe òkè ahụ pụrụ ịbụ.
Ọ bụ mgbe anyị na-aga n’ihu, hapụ Chineke, wee n'azụlite nrọ na ebumnobi nke onwe anyị, adabereghị na nzube Chineke, ka anyị na-enwe mmechu ihu nke ukwuu.
Cheta ụbọchị taa na Ọ bụ òkè GỊ, na O nwere onyinye nke akpachapụrụ ezigbote anya maputa, nke e jiri nwaayọọ zupụtara gị. Jizọs Kraịst rụrụ ọrụ maka gị. Ọ tara ahụhụ maka gị. O diri ọtụtụ ihe ọjọọ maka gị. Ọ gbara ọbara maka gị. Ọ nwụrụ maka gị. Mana nke kachasịnu, Ọ bụghị naanị na O buurù agha gị niile tinye n'ubu Ya, maka gị, O meriri ihe ọ bụla n'eyi gị egwù ka i wee bie ndụ zuru oke.
Chineke bụ ihe niile ị chọrọ. Ụnyaahụ, taa, na ruo mgbe ebighị ebi.
Okwu a niile a n'ekwu gbasara òkè emeela ka agụrụ́ gụwa m. A pụọ m ịga chọọ kuki m ga-ata.
Ntụgharị Uche:
- Kedụ ihe dị iche n'ịchọ ihe na ihe ịdị gị oke mkpa inweta? Ana m ahụta nke a n'ụzọ m si ele chokolet keeki anya. A chọrọ m iri ya oge niile, ma ikwu eziokwu, ọ bụrụ na m erighi ya tupu m nwụọ, ọ dịghị ihe ọ wepụrụ m n'ahụ. Ì kwerè na òkè Chineke nwere maka gị dabere karịa n’ọchichọ ka ọ bụ n'mkpa? Gụọ Matiụ 6:26-33. Gịnị ka Chineke na-agwa gị site n'Okwu Ya ebe a n'amaokwu ndị a?
- Ọtụtụ mgbe, iji mara òkè Chineke kwesiri ka anyị n'abia Ya nso, n'agụ Okwu Ya, na achụso ọnụnọ Ya. Kedụ ka ị si-eme nke ahụ taa?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke agawori n'ihu anyị ma sikwa n'azụ n'echebe anyị. Agha anyị niile bụ nke Ọ luchagorò. O kpuchigorì ebe ọbụla dị oghe nke ndụ anyị. Ọ dịghị ihe ọ bụla gbasara anyị na-adị Ya ka ihe ọhụrụ. Ihe ofufè nke ụbọchị ato a akpachara anya mee, ga-eme ka ị dị mgbamume n'ime eziokwu bụ na Chineke bụ Onye n'enye okè kpọmkwem, nha kpọmkwem, maka ndụ gị.
More