Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibi Mgbanwere: NzubeIhe Atụ

Living Changed: Purpose

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Ụzọ Nke Neguzozi Ọtọ

Imezu nzube anyị pụtara na ibi ndụ nyefee Chukwu n'aka. Mgbe anyị nyefere onwe anyị n'uche Ya, ọ pụtaghị na anyị kwesịrị ịnọdụ ala nemeghị ihe ọ bụla. Ọ pụtara na anyị na-achọ Ya mgbe niile ka anyị na-aga n'ihu. Akwụkwọ Nsọ kwere anyị nkwa na Ọ ga-eme ka ụzọ anyị guzozie, ma ka Ya duzie nzọụkwụ anyị, anyị kwesịrị na-aga

Ọtụtụ afọ gara aga, Chineke nyere m ulereanya na ọchịchọ ịmalite ozi nke ga-enyere ụmụ nwanyị nke afọ niile aka ịmụta otú ha ga-esi gbanyesie ike na njirimara ha na Kraịst. N'oge ahụ, amaghị m otú e si emezu nrọ ahụ buru ibu. N'ezie, aghọtara m na ọ gaghị eme n'otu abalị, ma amaghị m ebe m ga e bido! Anyị ga-achọ ebe oru, we otu nwere okwa, ego, nkwekọrịta bịanyere aka na ya, na ndụmọdụ gbasara iwu, naanị ịkpọ aha ole na ole. Kama inwe nkụda mmụọ, ekpebiri m iji ohere ndị Chineke tinyere n'ụzọ m tụkwasị ya obi na ihe ga-esi na ya pụta. Mgbe afọ ole na ole gachara, anyị me re mgbagha mbụ anyị. Amaara m na ọ gaghị eme ma ọ bụghị nrubeisi m iwere nzọụkwụ mbụ ahụ ma nyefee m n’uche Ya n’ụzọ ọ bụla.

Ọ na-atọ Chineke ụtọ mgbe anyị na-achọ Ya na mkpebi anyị. Ọbụna mgbe m mere mgbanwe na-ezighị ezi, ahụla m ka ọ na-atụgharị ụzọ m ma weghachite m n'ebe ọ chọrọ m. Onwere mgbe o doro m anya na O mere uzo, na oge O mechiri uzo. Ekwere m na Ọ na-arụ ọrụ ya niile n’ihi na ọ maara na obi m bụ ijere Ya ozi. Ọ bụrụ na anyị anabata Ya n'oge ọ bụla, nyefee ọdịnihu anyị, ma gbalịa ime mkpebi ndị na-asọpụrụ Ya, nzube Ya maka ndụ anyị ga-apụta ìhè.

N'agbanyeghị na ị maghị ebe ikpeazụ ị ga-aga, jụọ onwe gị ihe ị chere na Chineke na-edu gị ka i mee ugbu a. Ọ bụrụ na gị na ụmụaka dị mma, ị nwere ike ịgbalị ije ozi n'ozi ụmụ gị na ụka. Ọ bụrụ na ị maara nke ọma n'ịhazi, eleghị anya, ọ ga-amasị gị inyere ndi ime obodo gị aka iburu ihe ọhụrụ ma debe ihe n'usoro. Ọ bụrụ na ị maghị ebe Chineke na-edu gị, malite ịkpọ ndị mmadụ òkù n’ọgbakọ. Dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, a na-akpọ anyị nile ịkpọbata ọtụtụ mmadụ n’ime anyị ruo mgbe ebighị ebi.

Ndị Kọlọsi 3:23 na-ekwu, sị, “Tinye obi na mkpụrụ obi unu n’ọrụ ọ bụla unu na-eme, dị ka à ga-asị na unu na-eme ya maka Onyenwe anyị n’onwe ya, ọ bụghị nanị maka ndị ọzọ” (TPT). N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, dị nnọọ malite itinye onyinye gị n'ọrụ nke ọma na itinye onwe gị n'ọrụ n'ijere Alaeze Ya ozi. Ime nzọụkwụ a na-ejighị n'aka iji sọpụrụ Chineke, dị mma karịa ime ihe ọ bụla. Ekwela ka egwu ime ihe na-ezighị ezi mee ka ị ghara ịga n'ihu. Ọ kwesịrị ntụkwasị obi ịmepụta ihe pụrụ iche site na onyinye gị.

Chukwu, daalụ maka itinye m na atụmatụ ukwu gị. Ama m na ị nwere ọhụhụ maka ndụ m, a tụkwasara m obi na ị ga-eduzi nzọụkwụ m n'ime ebumnobi I zubere maka m. Nyere m aka ịnọgide na-ahazi ihe m malitere site na atụmatụ a. Nyere m aka ịhụ onwe m site na oghere nke eziokwu gị. Gosi m ihe na-amasị m, ihe m na-eme nke ọma, ihe m meriri, ebe ị na-edu m, na otú nchikota nke mpempe akwụkwọ ndị ahụ si eme ka m ruo eruo ịrụ ọrụ gị. Gaa n'ihu na-anụcha m ka m dị njikere ije ozi n'ọrụ ị wepụtaara m. Naanị ihe m chọrọ ime bụ iji ndụ m niile sọpụrụ gị. duziem, me kwa ka uzọm guzozie. N’aha Jizọs kacha dị ike na nke dị oke ọnụ ahịa, amen.

Anyị na-ekpe ekpere ka Chukwu jiri atụmatụ a jee ozi n’obi gị.
Chọgharịa Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ Ndị Ọzọ Nke Ibi Mgbanwere
Mụtakwuo maka Changed Women's Ministries

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Living Changed: Purpose

O nwetụla mgbe ị na-eche ihe Chineke kere gị ime ma ọ bụ jụọ Ya ihe mere i ji nwe ahụmahụ ụfọdụ? E kere gị n'ụzọ pụrụ iche maka ọrụ nke naanị gị nwere ike mejupụta. Ọ bụrụ na ị na-eche na ị furu efu, ma ọ bụ na ị na-ala azụ ịkwaga, atụmatụ ụbọchị ise a ga-enyere gị aka ịtụkwasị Chukwu obi, ka O nwere ike iduga gị n'nzube gị.

More

Anyị ga-achọ ịkele ndị Changed Women's Ministries maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.changedokc.com/