Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibi Mgbanwere: NzubeIhe Atụ

Living Changed: Purpose

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

N'Ime Nchere

Ubọchi atọ mbu nke atụmatụ a nyere gi ọtụtụ ihe iche n'echiche. Ọ ga adi nghọtanwu ọ buru na ina enwe mmetụta di egwu ka ina achọ ijikọ ihe ndi di n'etiti ihe inwere oke mmasi na ya, ihe idi nma na ya, na ihe ndi siri ike imeriri. Kama ị ga na enwe mgbakasi ahu ma obu n'echegbu onwe gi maka ya, makụọ oge di n'ime nchere. Ọ nwere ike ọ nwere ihe Ọ chọrọ ikụziri gi tụpụ Ya egọsi gi atụmatụ ndi Ọ nwere banyere gi.

Na nke m, ọ diri m ezigbọte mkpa ka m mụta idi n'ahụ onwe m site n'anya eziokwu nke Chineke tụpụ m nwee ike ihụ nnukwu fọtọ Ya maka ndu m. E nwere ọtụtụ oge m kwetara asi na e nweghi ihe m nwere ike inye nke mere na ọfọrọ obere m kwe ka ọ kwusi m ime ihe Chineke chọrọ ka m mee. Mgbe m n'ebidọ na nje Ozi, ọ di m ka amaghi m okwu Akwụkwọ Nsọ otu m kwesiri na enweghi m onyinye zụrụ oke ime ihe obula bara ụrụ. Agbanyeghi ihe ndi n'eme ka obi m ghara isi ike, e kwere m Chineke nkwa na a ga m ewere onwe m nyefee ihe obula Ọ ga edebe n'ihu m. Mgbe m pụtara na mpaghara m ebe ihe isi ike n'anọghi wee were onwe m nye maka ije ozi, ọ di m itunanya ichọpụta na ihe m nwere ike inye bu nke achọrọ na nke di nmasi. Eziokwu bu na ọ nweghi onye obula hubere m dika enweghi m ike ime ihe obula ma obu n'enweghi m onyinye, makwa Chineke. N'agbanyeghi nke a, E nyere m asi ndi nọ n'ime isi m nnukwu ike n'ime ndu m karia eziokwu nke Okwu Chineke.

Mọzis ghọtakwara mmetụta nke idi etọzụghi etọzụ iji mee ihe bara ụrụ. N'ime Akwụkwọ Nsọ nke Ọpụpụ, Chineke ji Mọzis tọhapụ ndi Izrel n'ọhụ nke Ijipt ma nye ha iwu nke ndi Jụụ ha sọọrọ karia afọ ọtụ nari. Mọzis bu ọtụ n'ime ndi ndú kachasi mkpa n'akụkọ banyere umu Izrel, mana mgbe Chineke kpọrọ ya ka ọ zọba ukwu n'ime nzube ahu, Mọzis ekwetaghi na ya rụrụ erụ banyere ọrụ ahu. Obunadi mgbe Chineke kwere ya nkwa inọnyere ya, Mọzis siri ọnwụ na ya adighi nma ma riọ Chineke ka Ọ zigaa onye ọzọ. Cheretụ ma chee echiche maka nke ahụ. Mọzis n'ekwụrụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile okwu bụ Onye oge n'enweghi ike ijigide, maara ihe niile banyere ihe ọbụla di ọmụma, makwa chọọ iji ya wee rụọ ọrụ. Nke ahụ kwesiri izụrụ inye Mọzis obi sii ike. Ma, ugbọrọ ole ka anyi n'eme otu ihe ahụ?

Ugbu a, ị nwere ike ị nweghi obi siri ike banyere nzube gi ma obu na idighi ike ime ihe ina enwe ntụzi ime. Mana inwere ike ikwe Okwu Chineke nke siri na gi nwere onyinye na ngọzi onyinye pụrụ iche. Ọ nwere ike inweghi ike imata onyinye ndi inwere maka na ha nwere ike idi ka ha abaghi ụrụ ma atụnyere ha na nke onye ọzọ ma obu na ina eleda ha anya maka na ha di mfe ọbibia. Eziokwu bụ, ihe ndi ahụ inwere ike ime n'esighiri gi ike abụghị ihe ndi onye obula nwere ike ime. Ihe inwere ike inye pụrụ iche, ma ekere gi ka irụọ ihe di mkpa n'atụmatụ Chineke. Jụọ Ya ihe ihe ahụ bụ.

Ọbụrụ na imaghi otu iga esi nụ ọlụ Chineke, mee ka imarụọ Ya ala. Gụọ okwu Ya, Akwụkwọ Nso, ubọchi niile. Zụọ ndu ekpere sikwụrụ ike site n'ikwụsara Ya okwu makwa igere Ya nti. Gbaa onwe gi gbụrụgbụrụ jiri ndi n'egọsipụta ọnyinyọ nke Kraisti. Gbaa mbọ gi na Chineke inwe mmekọrita di ọmimi, ma oge n'adighi anya, iga enwe ike ima odiiche di n'ọlụ Ya mgbe Ọ kpaliri gi.

Mgbe ina enwe mmetụta na ifụọla n'ime nchere, lekwasi anya n'ige Chineke ntị. Mụta ihe Ọ na ekwu banyere gi. Riọ Ya ka Ọ nyere gi aka rụpụta ma kpọpụta asi ndi digasi ka ha kwụsi inwe ikike n'ndu gi. Tụlee otu iga esi n'ebi ndu nrụbe isi ugbu a, n'ihe ndi di ntakiri, ka ị wee nwee ike idi njikere mgbe Ọ nyekwụrụ mkpụghe. Riọ Ya ka Ọ gosi gi ihe idi nma na ya, makwa gi di njikere inye Ya ihe niile inwere. Mee ihe ndia ka ina echere Ya maka na ọtụtụ mgbe, nzube anyi di n'akuku ebe njikere anyi idi nyefe ma ige nti nọ.

Chineke, ekelere m gi maka ike nzube pụrụ iche maka naani m. Nyere m aka ka m hụ onwe m site n'anya Gi makwa ka m lụfụọ asi ndi niile nwere ike ijigide m n'ala. Nyere m aka ka m kwere na ekere m jiri egwu na ebube n'ime ọnyinyọ Gi nakwa ọdighi onye ọzọ di ka m. Na afụchasi m ma kwadọ m maka nzube Ị nwere maka m. Gosi m nzọmụkwụ ozo m kwesiri ime iji biakwụtekwọ Gi nso makwa iji nyere m aka imejụpụta ohere nke Ị mewọọrọ maka m n'ime Ụlọ Nsọ Gi. N'aha Jizọs, amen.

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Living Changed: Purpose

O nwetụla mgbe ị na-eche ihe Chineke kere gị ime ma ọ bụ jụọ Ya ihe mere i ji nwe ahụmahụ ụfọdụ? E kere gị n'ụzọ pụrụ iche maka ọrụ nke naanị gị nwere ike mejupụta. Ọ bụrụ na ị na-eche na ị furu efu, ma ọ bụ na ị na-ala azụ ịkwaga, atụmatụ ụbọchị ise a ga-enyere gị aka ịtụkwasị Chukwu obi, ka O nwere ike iduga gị n'nzube gị.

More

Anyị ga-achọ ịkele ndị Changed Women's Ministries maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.changedokc.com/