Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Wepụ ỤjọIhe Atụ

Get Rid Of Fear

ỤBỌCHỊ 3 NKE 3

Ị nwetụla mgbe ị nọrọ n'ime ụgbọelu n'oge ọgba aghara siri ike? Ụgbọ elu ahụ nwere ike ya dika ọ dighị nchịkwa n'obere oge, ma obi erughị gị ala maka nke a. Ọ bụrụ na e kechigori eriri oche gị ekechi, ị nwere ike gi ekesikwụọ ya ike. Ọ nwere ike ịbụ na ị jidesiri aka nke oche gi ike nke obere. Ọ nwere ike ịbụ na obi ezughi gi oke n'ihi na inọ n'etiti elu na ala. Ikekwe ị malitere ịgụ otu ahịrị di n'akwụkwọ gị ugboro ugboro n'ihi ọgba aghara ahụ nke mere ka obi ghara izu gi oke.

Mana mgbe onyeisi ụgbọelu ahụ mere ọkwa sị: "Anyị abanyela n'ọgba aghara, n'ihi ya anyị ga-agbanwe otu anyị si efe ma gbalịa ịchọta ikuku dị mfe ife na." Ugbu a, nsogbu gị agbaghi oso. Ọgba aghara ka dịkwa ya. Ma eleghị anya ị kuru ume miri emi, nọzikwa n'oche gi, laghachi azụ n'ịgụ akwụkwọ ina agụbụ, ma nwee ahụ iru ala karịa n'ihi na ị kwụsịrị ilekwasị anya na ọgbaghara ahụ wee kama lekwasị anya na ọkwa nke onye ọkwọ ụgbọ elu mere.

Mgbe i wepụrụ uche gị n’ihe ị na-atụ egwu wee bugharịa ya na Chineke—Onye na-eduzi ndụ anyị nke ọma—ị ga-enwe mmetụta nke ụjọ gị n'ebelata.

Onye-nwe-anyị bụ Onye Amara, mgbe m n'ātu egwu, achọrọ m itukwasi Gi obi. Bikọ Ị ga-enye m ihe niile m chọrọ—echiche, eziokwu, na agbamume—iji mee nke ahụ n'ezie? Ị bụghị Chineke nke mgbagwoju anya, kama Chineke nke udo. Mgbe m n'anaghi enwe mmetụta udo, ewezụgawọ m onwe m n’ihu Gị. Nye m ike ka m wee nọrọ n’ime Gị, okwu Gị ga-adịkwa n’ime m, ma mụ enweta udo Gị nke ọma. N'aha Kraist. Amen.

Ihe ọgụgụ kwa ubọchị a na ekpere a ọ̀ masịrị gị? Anyị chọrọ ịgba gị ume site n'onyinye nke mbudata okwuchukwu mp3 atọ si n'aka Tony Evans na njikọ a, nke na-enye nkọmi maka ihe a tụlere taa. Naanị gaa na njikọ ebe a.


Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Get Rid Of Fear

Ị nwere ike imeri mmetụta ụjọ. Dr. Tony Evans na-edu gị n'ụzọ nke nnwere onwe n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a n'enye mmepe anya. Chọpụta ndụ nke añụrị na udo nke ị na-achọ kemgbe ka ị na-eme ihe ndị bụ eziokwu n'enweghi mgbaga ewepụtara n'ime atụmatụ a

More

Anyi ga-achọ ikele Ndi Ụlọ Nkwusa Owuwe Ihe Ubi maka inye atụmatụ a. Maka ọzi ndi ọzọ, biko gaa na http://go.tonyevans.org/addiction