Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Wepụ ỤjọIhe Atụ

Get Rid Of Fear

ỤBỌCHỊ 2 NKE 3

Gịnị ka ị ga-eme mgbe egwu malitere iri echiche gị ma ghara ịhapụ gị aka?

Akwụkwọ Nsọ kwuru na ihe ngwọta kasị mma nke egwu na nchegbu bụ ekpere. Iji hụ ihe ekpere gụnyere na ihe ekpere pụrụ ime maka ụjọ gị, lee Ndị Filipaị 4:6–7. Amaokwu nke isii kwuru si, "Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.”

Mgbe egwu jidere gị, malite site n'iji eziokwu nke Chineke gụzọgide egwu ahụ. Chineke kwuru na ị ga-atụgharịrịrị uche gị n'ihi na onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla na-achị uche gị, na-achị gị. Chineke achọghị ka ị lekwasị anya n'egwu di n'ime echiche gị ma ọ bụ ka ha na-achị gi. Kama, Chineke chọrọ ka i lekwasị anya na Ya ma kwe ka Okwu Ya na Mmụọ Ya na-achịkwa gị. Ọ bụ ya mere ekpere ji dị mkpa. Usoro nke a dị mfe. Atụla egwu maka ihe ọ bụla, kama kpee ekpere maka ihe niile.

Ndị Filipi 4:6 jiri okwu nke amazụrụ amazụ maka ekpere makwa okwu nke amaara kpọmkwem “aririo” nke pụtara irịọ azịza maka ihe a chọrọ kpọmkwem. N'ezie nke ahụ pụtara na ị ga-ekpe ekpere banyere ihe niile, ma arịrịọ gị ọ bụ maka ihe zụrụ ọha ma ọ bụ ihe ntakiri. Ọ bụrụ na ị nwere egwu na-enye gi nsogbu n'uche nke Ị na-enweghi ike ikọwapụta kpọmkwem ihe ọ bụ, buru ya gakwụrụ Onye-nwe-anyị n’ekpere—Ọ maara ihe ọ bụ. Ma ọbụ ọ bụrụ na ị nwere egwu pụrụ iche nke ị na-ahụ nke ọma n'ime uche gị, wegakwara Ya nke ahụ. Rịọ Ya ka Ọ nyere gị aka wepụ egwu gị ma jiri eziokwu Ya dochie ha, ma kelee Ya n'ime okwukwe maka imere gị nke ahụ.

Onye-nwe-anyị bụ Onye Amara, ọ̀ bu na-adighi ere nza n'ọnu-ọgugu senti abụọ? Ma Ị maara ihe niile na-eme ha. Ị gụwọkwa ntutu dị n’isi m ọnụ. Nyere m aka inwe obi siri ike n'ịmara otu Ị si mara m nke ọma na hụ m n'anya. Chetara m taa na ekwesighi m ịtụ egwu, n'ihi na Ị bụ onye na-achị ihe niile na Ị kwewọkwa nkwa na Ị gaghị ahapụ m ma ọ bụ gbahapụ m. Daalụ maka nkwa Gị niile, nke na-ewetara m udo. N'aha Kraist. Amen.


Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Get Rid Of Fear

Ị nwere ike imeri mmetụta ụjọ. Dr. Tony Evans na-edu gị n'ụzọ nke nnwere onwe n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a n'enye mmepe anya. Chọpụta ndụ nke añụrị na udo nke ị na-achọ kemgbe ka ị na-eme ihe ndị bụ eziokwu n'enweghi mgbaga ewepụtara n'ime atụmatụ a

More

Anyi ga-achọ ikele Ndi Ụlọ Nkwusa Owuwe Ihe Ubi maka inye atụmatụ a. Maka ọzi ndi ọzọ, biko gaa na http://go.tonyevans.org/addiction