Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Wepụ ỤjọIhe Atụ

Get Rid Of Fear

ỤBỌCHỊ 1 NKE 3

Ị dịla njikere ịmụta ka esi akwatu ebe siri ike nke egwu onye iro wuru n'ime obi na uche gị? Jizọs enyela gi aziza maka nke a. Ị ga-akwatu ya site n'ịgbanwe ihe ndị di gi mkpa. Nke a bụ kpọmkwem ihe Ọ na-ekwu na Matiu 6:33 mgbe Ọ sịrị, “Ma burunu ụzọ chọọ alaeze Ya na ezi omume Ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.”

N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na ị ga-etinye oge na ume gị iji kwadọọ onwe gị n'ihe Chineke na-eme n'ịkwalite alaeze Ya n'ụwa, Ọ kwere nkwa ina emere gị ihe niile n'ihe gbasara ihe ndị ọzọ na ndụ nke nwere ike ime ka ụjọ jide gị ma ọ bụ mee ka inwe nchegbu. Jizọs rụtụsiri nke a aka ike mgbe Ọ sịrị, “Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa.” (Amaokwu iri ato na anọ).

Chineke na-enye gị amara otu ụbọchị n'otu oge. Ọ gaghị enye gị amara echi n'ubochi taa, maka na nke ahu adighị gi mkpa. Gịnị kpatara nke a? N’ihi na Okwu Ya na-agwa anyị si, “Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onye-nwe-anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere Ya adịghị agwụ agwụ. Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi Gị bụ ihe kwudosiri ike.” (Abụ Akwa 3:22–23). Ya mere, ọ bụrụ na ị na-atụ egwu ma na-eche banyere ihe ga-eme echi, ị na-agwa Chineke n'ezie na ị tụkwasịghị Ya obi. Ị na-agwa Ya na Ọ bụghị onye a pụrụ ịtụkwasị obi. Ma gị na-ezipụ echiche gị n'ime ntụgharị oge mgbu na egwu nke ga-eme ka àgwà gị maka ichegbu onwe gi dịkwuo ogologo kama inyere gị aka merie ya. Ịtụ egwu maka echi bụ ịhapụ udo na mmeri gị taa. Hapụ ya ka ọ gawa.

Onye-nwe-anyị bụ Onye Amara, nyere m aka ịmata mgbe egwu na-aribata n’ime echiche m. Nyere m aka ijide echiche ndị a tupu ha amụbaa ma too. Nye m amamihe ka m mara ihe bụ ihe ezi uche na ihe na-abụghị ezi uche, ma n'ihe niile nye m ike ịtụkwasị obi na Ị nọnyeere m. Achọrọ m ịtụgharị egwu m nye Gị, yabụ biko nye m amara ime nke ahụ taa na ụbọchị niile. N'aha Kraist. Amen.

Ihe ọgụgụ nke ubochi taa na ekpere a ọ̀ masịrị gị? Anyị chọrọ ịgba gị ume site n'onyinye nke mbudata okwuchukwu mp3 atọ si n'aka Tony Evans na njikọ a, nke na-enyekwu nkọwa banyere ihe a tụlere taa. Naanị gaa na njikọ ebe a.
Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Get Rid Of Fear

Ị nwere ike imeri mmetụta ụjọ. Dr. Tony Evans na-edu gị n'ụzọ nke nnwere onwe n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a n'enye mmepe anya. Chọpụta ndụ nke añụrị na udo nke ị na-achọ kemgbe ka ị na-eme ihe ndị bụ eziokwu n'enweghi mgbaga...

More

Anyi ga-achọ ikele Ndi Ụlọ Nkwusa Owuwe Ihe Ubi maka inye atụmatụ a. Maka ọzi ndi ọzọ, biko gaa na http://go.tonyevans.org/addiction

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara