Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụkpụrụ nchịkwa oge sitere n'Okwu ChinekeIhe Atụ

Time Management Principles From God’s Word

ỤBỌCHỊ 6 NKE 6

Kwụọ Mba N'Ezoghị Ọnụ

Ka Mak na-emepe ihe ndekọ ya banyere ozi Jizọs, ọ na-akọwa Onye-Nzọpụta-Anyị dị ka Onye n'agwọ ndị mmadụ ma n'elu ma n'ala, chụpụrụ mmụọ ọjọọ ndị nọ n’ime otu nwoke nọ n’ụlọ nzukọ ma gwọọ nne nwunye Pita n’ụlọ ya dị na Kapaniọm. N’uhuruchi nke ụbọchị ahụ, “ndị mmadụ kpọtakwaara Jizọs ndị niile na-arịa ọrịa na ndị mmụọ ọjọọ ji. Obodo ahụ dum gbakọtara n’ọnụ ụzọ ụlọ ebe Ọ nọ, Jizọs wee gwọọ ọtụtụ mmadụ.”

N'ụzọ n'atughị n'anya, ụtụtụ echi ya ụmụ azụ Jizọs gbarala ọsọ bịakwute Ya wee sị, “Onye ọ bụla n'achọ Gi!” N'ezie ndị obodo ahụ enwetala nte akụkọ banyere ike ọrụ ebube nke Jizọs iji gwọọ nrianria ma ọ bụ chụpụ ajọ mmụọ ha wee chọọ ka Ọ mee ya ọzọ n'ụbọchị nke abụọ. Mana Jizọs sịrị mba. Ikekwe n'ụzọ ndị na-eso ụzọ Ya esighị chee ma ọlị, Jizọs sịrị: “Ka anyị gaa n’obodo nta ndị dị nso ka M wee kwusaakwa ozi ọma n’ebe ahụ. N’ihi nke a ka M ji wee bịa.”

Nke a bụ nke mbụ, ma n’ezie, ọ bụghị oge ikpeazụ anyị nụrụ ka Jizọs na-ekwu “mba” n’ozi ọma. Gịnị mere Jizọs jiri sị “Mba”? O pụtara ìhè na Ọ nwere ike ịgwọ ọtụtụ ndị mmadụ. O bụ ezie na Ọ nwere mmasị ibelata ihe mgbu dị n'ndụ ndị a. Ma n’agbanyeghị na Jizọs nwere mmasị sịrị ike ịgwọ ọtụtụ mmadụ, Ọ maara na Ọ nwere oge dị nta n’ụwa iji mezuo “nzube” Ya. Jizọs abịaghị n’ụwa naanị ka Ọ gwọọ ndị mmadụ na ikpughe onye Ọ bụ. Ọ bịara ikwusa ozi ọma na ikwadebe maka oke ịchụàjà Ọ ga-eme n'obe. Ọ doro Jizọs anya maka nzube Ya, nke a mere ka Ọ si mba nye ihe ọma ka Ọ wee nwee ike ilekwasị anya n'ihe dị mkpa Ọ bịara n'ụwa ime.

Ọ bụrụ na Jizọs enweghị ike ịsị ee nye ihe niile, anyị apụghịkwa ịsị otu ahụ. Mụ na gị nwere obere oge na akụrụngwa n'ejughị ebe niile. Iji jiri oge anyị nwere rụpụta ihe bara uru, ọ dị oke mkpa na ọ ga-edo anyị anya nke ukwuu ihe anyị kwenyere na Chineke kpọrọ anyị ka anyị mee ma nwee omume nke ịsị mba nye ọtụtụ ihe—ọbụna ndị dị mma n'ezie —na-adọpụ uche anyị n'ebe ozi anyị dị mkpa nọ.

Ya dị gị n'uche, e nwere ebumnobi ị ji dị ndụ! A na m ekpe ekpere na Akwụkwọ Nsọ anyị nyochara n'ime ụbọchị isii gara aga ga-ama anyị aka ka anyị mara ihe banyere otu anyị si eji oge anyị nwere n'ụwa a eme ihe, jiri oge nke ikpeazụ anyị hụ Chineke n'anya, hụ ndị ọzọ n'anya, na mete ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst site na ndụ anyị na ọrụ anyị.

Ọ bụrụ na usoro ọgụgụ a tọrọ gị ụtọ, ihe ọgụgụ ofufe m na-eme kwa izu ga-amasịkwa gị, na-enyere gị aka n'ụzọ dị ukwuu ijikọ ozi ọma na ọrụ gị. Debanye aha gị ebe a.

Igodo: ụbọchị_isii ụbọchị_isii

Okwu Chukwu

Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Time Management Principles From God’s Word

Ọ na-ewe gị iwe na enweghị karị awa iri abụọ na anọ n'ụbọchị? Ọnụọgụ ọrụ ị depụta ị ga-eme ọ karịrị akarị? Ike agwụla gị na ime ike ọgwụgwụ gbakwunyere na oge ezuru iji neba anya n'Okwu Chineke ma ndị enyi na ndị ezinụlọ gị? Ndị a nwere ike ịbụ mgba ana-agbakarị n'ụwa. Ozi ọma ahụ bụ na Akwụkwọ Nsọ enye go ụkpụrụ doro anya maka ijikwa oge anyị nke ọma. Atụmatụ a ga-akọwawapụta Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ ma nye gị ndụmọdụ bara uru maka otu ị ga-esi jiri oge fọdụrụ na ndụ a!

More

Anyị ga-achọ ikele Jordan Raynor maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.jordanraynor.com/time/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara