Ụkpụrụ nchịkwa oge sitere n'Okwu ChinekeIhe Atụ
Mee Atụmatụ Ihe Ị Ga-eme Kwa Ụbọchị
Ọ bụghị ihe nzuzo na iji nwee ihe ịga nke ọma banyere ego gị, ị ga-emerịrị atụmatụ ebe ị ga-emefu ego gị tupu ọ banye n'ebe ị na-edebe ya n'ụlọ akụ gị. Anyị kwesịkwara ime otu ahụ banyere oge anyị. E kwuwe, n'adịghị ka ego, ọ nweghị ihe anyị pụrụ ime iji mee ka oge mụbara anyị karịa ka nke anyị nwere, ya mere anyị kwesịrị ịdị na-enwe mmanye ịhazi oge awa anyị karịa dollar anyị.
Ọ bụrụ na i gbasoro ụzọ Jizọs n’ụbọchị nke abụọ nke usoro ọgụgụ a, i kwesịrị inwe nkewapụta doro anya banyere oge ị raara onwe gị nye iji rụpụta ihe n’otu ụbọchị. Ka ị mesịrị nkewapụta ndị a, chịkọtachaa nkwa gị niile, rụtụchaa aka ọrụ ole na ole na ihe ndị ị ga-eme dị mkpa, oge eruola ịbanye n'ụdị usoro eji eme ihe dị nkebi nkebi karịa ka ị mabu, iji kpebie ka ị ga-esi na-eji awa ọ bụla n'ụbọchị ọ bụla eme ihe. Ahụrụ m okwu Jizọs na Luk 14:28 n’anya: “N’ihi na onye n’ime unu, nke chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụgodi ala gbakọọ ihe ọ ga-efu ya iji mara ma o nwere ihe ga-ezuru ya ịrụzu yabụ ụlọ elu?” Ụzọ anyị si 'agbakọ ihe ọ ga-efu anyị' nke ọrụ anyị na-arụpụta bụ site n'ikewapụta oge anyị, hụ na anyị nwere "oge zuru oke imezu" ihe ndị anyị kwadoro ime.
Ya mere, kedu ka ime ihe nke a si adị n'ìhè? Nye m, ana m eji nkeji iri atọ ikpeazụ nke ụbọchị ọrụ ọ bụla na-achọpụta ihe ndị m ga-eme na ọrụ kachasị m mkpa m chọrọ ịrụzu n'echi ya na ịhazi otù m ga-esi nye oge m iji mezuo ihe ndị ahụ na ihe ọ bụla ọzọ m kwadebere ime. N'ụzọ dị otú a, mgbe m nọdụrụ ala na tebụl m n'ụtụtụ echi ya, agaghị m ala n'iyi oké ike ume echiche m iji chepụta ihe m ga-eme ọzọ. Emeelari m mkpebi ndị ahụ. Ugbu a naanị ihe m ga-eme bụ ibido mewe ihe ka m si wee kwadoo.
N'oge niile n'Akwụkwọ Ilu, Chineke na-ekpughe amamihe dị n'iji nlezianya mee atụmatụ ka anyị ga-esi na-eji oge na ego anyị eme ihe. Mgbe ị na-eme atụmatụ banyere ụbọchị gị, kpachara anya wedatụ ihe ị nwere ike irụzu n'ime awa iri abụọ na anọ. Ọdịdị mmadụ bụ ịwelicha ihe anyị nwere ike ịrụzu n'otu oge. Naanị ịmara nke a ga-enyere gị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha n'ime atụmatụ banyere oge gị. Ọ ka mma iji oge ị n'enweghị ọrụ ị ga-arụ na ya nke ị na-atụghị anya ya n'iga enwe mechie ụbọchị gị karịa na ị mezughị ihe ndị ị zubere ime.
Cheta ịdọ aka ná ntị Jizọs na Luk 14:29-30: “N'ihi na ọ bụrụ na ị tọọ ntọala iji arụ ụlọ ma gị enweghị ike iwuzu ya, onye ọ bụla nke na-ahụ ya ga-akwa gị emo, na-asị, “Onye a malitere iwu ụlọ ma ọ wuzughị ya.” Ịghara ime ihe anyị sịrị na anyị ga-eme na-emebi ịgba aka ebe anyị nye ụwa furu efu. Hazie oge gị nke ọma iji hụ na ị nwere ike imecha ihe ndị ị raara onwe gị nye na-iga amalite.
Igodo: ụbọchị_ise ụbọchị_iseOkwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ na-ewe gị iwe na enweghị karị awa iri abụọ na anọ n'ụbọchị? Ọnụọgụ ọrụ ị depụta ị ga-eme ọ karịrị akarị? Ike agwụla gị na ime ike ọgwụgwụ gbakwunyere na oge ezuru iji neba anya n'Okwu Chineke ma ndị enyi na ndị ezinụlọ gị? Ndị a nwere ike ịbụ mgba ana-agbakarị n'ụwa. Ozi ọma ahụ bụ na Akwụkwọ Nsọ enye go ụkpụrụ doro anya maka ijikwa oge anyị nke ọma. Atụmatụ a ga-akọwawapụta Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ ma nye gị ndụmọdụ bara uru maka otu ị ga-esi jiri oge fọdụrụ na ndụ a!
More