Ụkpụrụ nchịkwa oge sitere n'Okwu ChinekeIhe Atụ
Kpebie Ihe Dị Mkpa
Mata bụ onye n'enwetaghị ee banyere omume ya n’nkwusa anyị nke akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na Luk Isi Nke Iri. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na, anyị nile n'eme ka Mata site n’oge ruo n’oge, n'enwe ndoli ịmata ọrụ ndị kasị mkpa n’oge ọ bụla. Ọ bụ ezie, ọ dị mkpa ka mmadụ sie nri abalị, a dịkwa m njikere ikwu na Jizọs nwere ekele dị ukwuu maka ile ọbịa Mata mere. Ọ bụghị na isi nri nri abalị adịghị mkpa. Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụghị ihe kacha mkpa Mata ma ọ bụ Meri nwanne ya nwaanyị gaara eme n’oge ahụ. Ihe kacha mkpa ime n'oge ahụ bụ ịnata nkụzi n'ụkwụ ụkwụ Jizọs.
Dị ka anyị hụrụ ụnyaahụ, ịnakọta nkwa anyị, ihe ndị anyị ga-eme na ọrụ anyị bụ nzọụkwụ dị mkpa nke njikwa oge dị irè. Ma ozugbo inakọtara nkwa gị niile, oge eruola ikpebi ihe ndị i depụtara bụ ọrụ na ihe ndị ị ga-eme kacha mkpa. Usoro a bụ nke ịme ka ọ doo onwe gị anya ihe ị kwenyere na Chineke na-akpọ gị ime n'oge ndụ a na n'ọrụ gị. Ka ị buuru ihe a dọrọ anya na ihe ndị kasị mkpa ị kwesịrị ime n’uche, jụọ onwe gị, “Gịnị bụ otu ihe, ozugbo e mechara ya, ga-eme ka ihe ọ bụla ọzọ dị n’ime ọrụ a dị mfe ma ọ bụ nwekwụọ mkpụrụ?” Azịza nye ajụjụ a bụ ihe kacha mkpa ị kwesịrị ilekwasị anya na ya. Hapụ ihe niile ị nwere ike ịhapụ ruo mgbe ị mechara otu ihe a. Mgbe ị mechara ihe nile a, megharịa usoro a ugboro ugboro.
Mgbe m na-ede akwụkwọ ikpeazụ m, Akpọrọ Ị Mepụta, enwere m oke ọrụ nke ihe ndị a ga-eme iji weta akwụkwọ m ahụ n'ahịa. Ọrụ dịịrị m nke inweta onye-nnọchi-anya, ime ka onye mbipụta kwenye n'akwụkwọ m, igba ajụjụ ọnụ, ide mkpụrụ okwu puku iri ise, iwu ihe nguzosi iji kwusaa maka akwụkwọ ahụ, wdg. Ma, na mbido nke ọrụ banyere akwụkwọ m ahụ, a maara m na ọ bụrụ na m enweghị ike inweta onye-nnọchiteanya, ọ dịghị ihe ọzọ n'ime oru ahụ ga-adị mkpa. Ị nweta onye-nnọchi-anya bụ ọrụ m kacha m mkpa. Ya mere m ji hapụchaa ihe ọ bụla ọzọ dị na ọrụ akwụkwọ m ahụ ruo mgbe m chọtara onye-nnọchi-anya ga-enyere m aka.
Nke bụ eziokwu bụ na, n'oge ọ bụla, ọ dị ihe ndị a ga-eme na ọrụ ole na ole dị mkpa n'ezie. Banye n'omume nke ịchọpụta ihe abụọ ma ọ bụ atọ dị mkpa ị kwadebere ime ma tinye ha uchu ruo mgbe ị rụchara ọrụ dị na ha.
Igodo: ụbọchị_anọ ụbọchị_anọOkwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ na-ewe gị iwe na enweghị karị awa iri abụọ na anọ n'ụbọchị? Ọnụọgụ ọrụ ị depụta ị ga-eme ọ karịrị akarị? Ike agwụla gị na ime ike ọgwụgwụ gbakwunyere na oge ezuru iji neba anya n'Okwu Chineke ma ndị enyi na ndị ezinụlọ gị? Ndị a nwere ike ịbụ mgba ana-agbakarị n'ụwa. Ozi ọma ahụ bụ na Akwụkwọ Nsọ enye go ụkpụrụ doro anya maka ijikwa oge anyị nke ọma. Atụmatụ a ga-akọwawapụta Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ ma nye gị ndụmọdụ bara uru maka otu ị ga-esi jiri oge fọdụrụ na ndụ a!
More