Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 104

104
1Gọzie Jehova, nkpuru-obim.
Jehova, Chinekem I di uku nke-uku;
Ebube na ima-nma ka I yiriworo dika uwe.
2Gi Onye nēji ìhè kpuchi Onwe-gi dika uwe-nb͕okwasi;
Onye nēseti elu-igwe dika ákwà-nkwuba:
3Onye nēdo ihe-njikọta nke ime-ulo-elu-Ya nile nime miri:
Onye nēme igwe-oji ka ha buru ub͕ọ-ala-Ya;
Onye nējeghari n'elu nkù abua nke ifufe:
4Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe;
Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:
5Ọ tọwo ntọ-ala uwa n'elu ọnọdu-ya guzosiri ike,
Ka aghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.
6I were ob͕u-miri kpuchie ya dika uwe;
N'elu ugwu nile ka miri nēguzo.
7Site n'ibasi-nba-ike-Gi ha nāb͕alaga;
Site n'olu éb͕è-elu-igwe-Gi ha nāzọli ọsọsọ;
8(Ugwu nile nārigo, ndagwurugwu nile nārida;)
Rue ebe ahu nke I tọrọri ntọ-ala-ya nye ha.
9I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya;
Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa.
10Gi Onye nēzipu isi-iyi di iche iche ka ha ba na ndagwurugwu;
N'etiti ugwu ka ha nērù:
11Ha nēnye anu ọhia ọ bula miri iṅu;
Inyinya-ibu-ọhia nēmeju akpiri-ikpọ-nku-ha.
12N'akuku ha ka anu-ufe nke elu-igwe bi,
Ha nēsi n'etiti alaka-osisi me ka olu-ha da udà.
13I bu Onye nēsi n'ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri:
Afọ nēju uwa site na nkpuru nke ọlu-Gi nile.
14I bu Onye nēme ka ahihia puere anu-ulo
Nēme kwa ka ihe akuru n'ala puere ọlu-ubi madu;
Ime ka nri si n'ala puta:
15Na manya-vine nke nēme ka obi madu ṅuria,
Ime ka iru-ya nēb͕upu site na manu,
Na achicha nke nēme ka madu nwe ume n'obi.
16Afọ nēju osisi nile nke Jehova;
Bú osisi cedar nke Lebanon, nke Ọ kuworo;
17Ebe umu-nnunu na-akù akwú:
Ub͕ala, osisi fir bu ulo-ya.
18Ugwu nile di elu diri ewu-ọhia;
Nkume nile di elu buru aṅu ebe-nb͕abà.
19O mere ọnwa ka ọ buru ihe igu mb͕e di iche iche akara àkà:
Anyanwu mara ọdida-ya.
20I nēme ka ọchichiri b͕a, o we buru abali;
Nime ya ka anu nile nke oké ọhia nākpuputa.
21Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u,
N'ichọ kwa ihe-oriri-ha n'aka Chineke.
22Anyanwu nāwa, ha we chikọta onwe-ha,
We mākpuru n'ebe-obibi-ha di iche iche.
23Madu nāpu ga ọlu-ya
Ga kwa ọlu-ubi-ya rue anyasi.
24Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova!
N'amam-ihe ka I meworo ha nile:
Uwa juputara n'ihe I nwetara.
25Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua,
Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu,
Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku.
26N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga;
Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.
27Ha nile nēle anya Gi,
Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.
28I nēnye ha, ha achikọta ya;
I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha.
29I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji;
I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume,
We laghachi n'ájá-ha.
30I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha;
I we me ka iru ala di ọhu.
31Ka ebube Jehova dirue mb͕e ebighi-ebi;
Ka Jehova ṅuria n'ọlu-Ya nile:
32Onye nēlegide uwa, o we ma jijiji;
Ọ nēmetu ugwu aka, ha we kwua anwuru-ọku.
33M'gābùku Jehova abù n'ogologo ndum nile:
M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.
34Ka ntughari-uchem tọ Ya utọ:
Mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova.
35Ka eme ka ndi-nmehie si n'uwa gwusia,
Ka ndi nēmebi iwu ghara kwa idi ọzọ.
Gọzie Jehova, nkpuru-obim.
Tonu Ja.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 104: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye