Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 105

105
1Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;
Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.
2Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;
Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.
3Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya:
Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.
4Nāchọnu Jehova na ike-Ya;
Chọnu iru-Ya mb͕e nile.
5Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;
Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;
6Unu nkpuru Abraham, bú orù-Ya,
Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.
7Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi:
N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di.
8O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi,
Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;
9Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara,
Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;
10O we me ka o guzoro Jebok ibu ukpuru,
Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:
11Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean,
Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:
12Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole,
E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;
13Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ,
Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ.
14Ọ kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;
O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;
15Si, Unu emetula ndim etere manu aka,
Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam.
16O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu;
Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri.
17O zìri otù nwoke iga n'iru ha;
Erere Josef ka ọ buru orù:
18Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike;
Nkpuru-obi-ya bàra n'ígwè:
19Rue mb͕e okwu-Ya rère;
Okwu-ọnu Jehova nuchara ya.
20Eze ziri ozi, we tọpu ya;
Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ.
21O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya,
Na onye nāchi ihe nile o nwetara:
22Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ,
Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe.
23Israel we bata nime Ijipt;
Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n'ala Ham.
24O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku;
O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha.
25Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì,
Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ.
26O zigara Moses, bú orù-Ya,
Na Eron onye Ọ rọputara.
27Ha doro n'etiti ha ihe iriba-ama-Ya nile,
Do kwa ihe-ebube di iche iche n'ala Ham.
28O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie;
Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile.
29Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara,
We me ka azù-ha nwua.
30Ala-ha nuputara awọ,
N'ime-ulo nile nke ndi-eze-ha.
31O kwuru okwu, odudu we bia,
Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile.
32O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé,
Na ọku nēnwu enwu n'ala-ha.
33O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe;
Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha.
34O kwuru okwu, igurube we da,
Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu,
35Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n'ala-ha,
Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha.
36O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha,
Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.
37O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo:
Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile.
38Ijipt ṅuriri mb͕e ha putara;
N'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ha.
39Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi;
Na ọku inye ìhè n'abali.
40Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia,
O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha.
41O meghere oké nkume, miri we rùputa;
Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri.
42N'ihi na O chetara okwu nsọ Ya,
Na Abraham, bú orù-Ya.
43O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta,
Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta.
44O we nye ha ala nile nke mba Kenean nile;
Ọ bu kwa ihe ndi ọzọ di iche iche dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inwe ka ha nwetara:
45Ka ha we debe ukpuru-Ya nile,
Riba kwa iwu-Ya nile ama.
Tonu Ja.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 105: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye