ABÙ ỌMA 103
103
Abù Ọma nke Devid.
1Gọzie Jehova, nkpuru-obim;
Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya.
2Gọzie Jehova, nkpuru-obim,
Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:
3Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile;
Onye nāgwọ ọria-gi nile;
4Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi;
Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche:
5Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi;
Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo.
6Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕u
Ezi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe.
7Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile,
Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile.
8Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara,
Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere.
9Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu;
Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe.
10Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi,
Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi.
11N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa,
Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya.
12Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu,
Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.
13Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya,
Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya.
14N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi;
Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu.
15Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di;
Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko.
16N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi;
Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ.
17Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya,
Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu;
18Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya,
Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha.
19Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe;
Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile.
20Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya,
Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya,
N'ige nti olu nke okwu-Ya.
21Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile;
Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ.
22Gọzienu Jehova, unu ọlu-Ya nile,
N'ebe nile Ọ nāchi:
Gọzie Jehova, nkpuru-obim.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
ABÙ ỌMA 103: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.