OlileanyaIhe Atụ
- Ọ bụrụ na ị na-agbasi mbọ ike n'ihe, ị ga-enwekwu ihe ịga nke ọma na yabụ ihe, ọ bụghị eziokwu? Mana ọ bụrụ na gị akwụsị irusi ọrụ ike ka ị kwesịrị, i gaghị enweta ihe ndị buru ibu site na yabụ ọrụ dịka i tụrụ anya. Ịdị́ uchú n'ihe ọ bụla ị n'eme bụ isi. Jiri obi gị niile n'eme ọrụ ọbụla dị gị n'aka, ihe ọbụla o bụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma ọ bụrụ na ịchọrọ inwe olileanya. Ị ga-eji ikwesị-ntụkwasị-obi họrọ olileanya, hapụ egwù. Ọ na-eme ka obi sie gị ike, gị abụrụkwa onye ịnọnyere n'enyekwu ndị mmadụ obi ụtọ!
Ndị Hibru 6:11 Ọ kwa ịma na ọ bụrụ na ị bụghị onye n'eme enyi, ọ dịghịkwanu onye ga-abụ enyi gị? Mana, ihe na-atọ ọchị bụ, mgbe ị bụ onye n'eme enyi, ọ dị́ ka ị nwere ọtụtụ ndị enyi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ebe Chineke nọ. Ọ bụrụ na ị na-eleghara Chineke anya, ọ dị́ ka Ọ dị anya. Ma ọ bụrụ na ị na-achụso Chineke site n'ekpere na Okwu Ya, ọ dị́ ka Ọ dị gị ezigbo nso. Nwanne, ị hụlanu ya. Ọ bụ naanị n'ime Chineke ka ị ga-enweta Olileanya. Bịaruo Ya nso! - Ndị Kraịst kasị nwee olileanya nwere obi ụtọ dị ukwuu n'ebe Onye-nwe-anyị nọ. Ha hụrụ Okwu Chineke n’anya nke mere na ha na-agụ ma na-eburu Ya n’isi. Ha na-ekpekarị ekpere. Ka m gwa gị, Ọ BỤ Okwu Chineke na-enye olileanya. Ọ bụ Akụkọ banyere Ya. Akụkọ niile banyere ihe mere-eme na amụma niile mezuru-emezu na ya n'egosi anyị na Chineke na-achị ma nwee atụmatụ gbasara anyị na ihe niile. Ihe ka mkpa bụ ka ị nọgidesie ike n'ihe ọbụla ị n'eme ugbu a! olileanya ga-esi n'ime gị malite!
Ndị Rom 15:4
Jemis 4:8
Amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị a dị na Ngwá mobaịl anyị, Mac ma ọ bụ Windows programụ na em> MemLok Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Nke MemLok Ndị Ọzọ
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
OLILEANYA. Ka anyị leba anya n’Amaokwu Ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ n'ekwu maka olileanya. Chineke chọrọ ka ị nọrọ n'udo, n'atụghị egwu, jupụta n'okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ọ bụghị ya? Ọ gaghị achọ ka ị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ ka iwe ju gị n'obi. Amaokwu gasị n'ekwú maka olileanya dị́ n'ime Akwụkwọ Nsọ na-akụziri gị ka ị ga-esi bụrụ onye ime mgbaghara n'adịghị enye nsogbu. Amamihe na-abịa site na ịtụgharị uche na Okwu Chineke.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele MemLok, Sistemụ Ebe Nchekwa Akwụkwọ Nsọ, maka ịnye nhazi banyere atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ gbasara MemLok, gaa na: http://www.MemLok.com