OlileanyaIhe Atụ
- Ó nweela ụfọdụ oge na ndụ m mgbe m chere na ihe jọgburu onwe ya na njọ na ndụ m. Oge ndị ahụ bụ oge olileanya funahụrụ m. Mụ a n'eche, "Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe gbanwere n'ọnọdụ a, amaghị m ma m nwere ike ịchekwa ndụ ihu." N'ileghachi anya azụ n'ọnọdụ ndị ahụ, ọ dịghịzi ihe na-agbagwogu m anya banyere ha. Ahụhụ niile m tara na ọnọdụ ndị ahụ kụziiri m na Chineke nọ n'ọrụ kama ọ bụ m n'amaghị gbasara ihe ndị Ọ nọ n'eme, oge ahu. Atụmatụ Ya gasị dị m ihò ụbọchị taa karịa ka m si ahụ ha ụnyaahụ. Nke a na-enye m olileanya. Chineke nọ n'eche banyere m, wee nwee atụmatụ mara mma maka ndụ m. Tukwasi Chineke obi. Ọ bụ Onye a pụrụ ịtụkwasị obi.
Jeremaya 29:11 - Ọ̀ dịtụla mgbe i chere ihe dị ka "Ọ dịghị onye hụrụ m n'anya n'ezie - A bụ m onye mmebi!"? A ma m, na ka m n'ebị ndụ n'ụwa a, emejọwo m ndị mmadu. A mara m onwe m ikpe. E nwekwara m obi abụọ wee bido ledawa onwe m anya. Mana nke a bụ ihe m kwesịrị ijide n'aka. Chineke maara m karịa ka onye ọ bụla siri mara m. Ọ bụ Ya KERE m. Ọ bụ Ya kere uche m ma nye m ọnụ. O NWEKATAGHỊ kwụsị ịhụ m n'anya. O ji ikwesị-ntụkwasị-obi Ya nọgide m ruo mgbe ebighị-ebi. Ụbọchị ọ bụla bụ nke mmalite ọhụrụ n'ebe Chineke nọ.
Abụ Ákwá 3:22-23 - Ụfọdụ nwere ike ịsị "Ịhụ ihe bụ ikwere na ọ dị adị". Mba, nke eziokwu bụ, "Ikwere n'ihe bụ ịhụ ya n'ezie". Anya ime mmụọ m meghere ụbọchị m kwere na Onyenwe m na Onye-Nzọpụta m bụ Jizọs Kraịst. Ugbu a, nke ahụ bụ EZI OLILEANYA.
Ndị Rom 8:24-25 - Obi ntiwa? Obi nkụda? Ka m gwa gị, agabigawo m ihe ndị a. Ha bụkwanụ ọnọdụ n'adịghị adịgide. A ma m na ị gaghị ekwe nke a, mana ọ bụ eziokwu. Ị bụ kpọmkwem onye e tere Jizọs mmanụ ka Ọ bịa zute! Ọ nọ n'ọrụ ọbụna ka ị n'agụ ihe a. O nwere ozi maka gị ị ga-ebu n'obi, jiri ya nye onwe gị mgbamume. Ozi ahụ bụ "Tughapú onwe gị n'agbụ nke obi". Ị ga-enwere onwe gị ma jupụta n'olileanya ma ọ bụrụ na ị nabata na kwere Ya!
Aịsaịa 61:1
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
OLILEANYA. Ka anyị leba anya n’Amaokwu Ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ n'ekwu maka olileanya. Chineke chọrọ ka ị nọrọ n'udo, n'atụghị egwu, jupụta n'okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ọ bụghị ya? Ọ gaghị achọ ka ị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ ka iwe ju gị n'obi. Amaokwu gasị n'ekwú maka olileanya dị́ n'ime Akwụkwọ Nsọ na-akụziri gị ka ị ga-esi bụrụ onye ime mgbaghara n'adịghị enye nsogbu. Amamihe na-abịa site na ịtụgharị uche na Okwu Chineke.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele MemLok, Sistemụ Ebe Nchekwa Akwụkwọ Nsọ, maka ịnye nhazi banyere atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ gbasara MemLok, gaa na: http://www.MemLok.com