OlileanyaIhe Atụ
- Ị n'ahu na ọ bụ mgbe i n'enye Chineke otuto ka ị na-ejupụtakwu na olileanya? Olileanya na otuto bụ otụ na nwanne. Meghee obi gị nye Chineke otuto maka otu ihe ugbu a. Ị mee nke a, ọ bụrụ na olileanya gị n'anwụ anwụ, ị ga-ahụ na ọ ga-ebilite kụwa ume ọzọ! Olileanya bụ nhọrọ dịịrị gị i ga-eme. Na-agba mbọ ị na-ahọrọ olileanya hapụ obi nkụda. Inwe olileanya na inwe obi nkụda abụghị ihe ị pụrụ ime n'otu oge. Ọ bụ nhọrọ dịịrị gị ị ga-eme. Chineke kwesịrị ntụkwasị obi. Chineke dị MMA. Abụ Ọma 71:14
- Ọchịchọ gị niile bụ nke Chineke pụrụ imezu nye gị. Ọ bụrụ na ị dara mbà n'obi, jụọ onwe gị si "O nwere ihe m n'enwe olileanya na ya hapụ Chineke?" Ọ dịghị ihe a na-ahụ anya na-enye ezi olileanya. Mgbe ị werela olileanya gị tinye na mmadụ, ihe ma ọ bụ Mmemme-Gasị, ụdị nkụda obi i ga-enwe ga-eme gị ka ị na arịa ọrịa. Ịcheré Chineke adịghị mfe. Ọ dịghịkwanu ihe na-eju afọ ogologo oge ma ọ bụghị nnọọ nkenke. Ọchịchọ niile nke obi gị bụ nke Chineke pụrụ imezu nye gị!
Ilu 13:12 - Onye iro - Ekwensu - n'ekwu okwu na ntị gị, sị: "Ọ dịghị onye pụrụ ịghọta ka obi si dị m arịrị." Nke ahụ bụ ezigbo ASÍ. Ọ bụrụ na gị ekwenyere así ekwensu a, ị ga-ahụ onwe gị ka ị na-amịkpụ n'ime obi ọjọọ na obi ilu. MA, ka m gwa gị, ị NỌGHỊ naanị gị. Ì chè na Chineke aghọtaghị ọnọdụ gị? Ị maghị na o nwere ike, ike agwụwala Ya ịna anụ na obi agbawaala gị, ọzọkwa? Enwekatala kwenye na Chineke adịghị ahụ ọnọdụ gị. Ọ hụrụ gị n'anya NKE UKWUU. Ọ ga-enye gị ike ka ị n'aga n'ihu. Ọ ga-emekwa gị ka ị sikwuo ike!
Aịzaya 40:28-29 - Mmadụ na-ekwu, sị: “O nwere ụfọdụ ihe ndị yiri ka Chineke apụghị imenwu ha.” Enyi, ugbu a ụdị okwu ahụ ọ bụghị nke na-ekwesịghị isi n'onu mmadụ pụta, ma anyị kwuo eziokwu? Ma, ọtụtụ mgbe ka anyị na-adaba n'ime yabụ ụgha. Mgbe niile anyị kwesịrị iji olu ike na obi ike n'ekwu si, "Ọ dịghị nzube Chineke nke a pụrụ igbochi". A pụghị imeri Onye kere eluigwe na ụwa. Ọ mazụrụ ihe niile! Ụdị okwukwe ahụ bụ nke n'amụpụta olileanya!
Job 42:2
Amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị a dị na Ngwá mkpanaka anyị, Mac ma ọ bụ Windows programụ na MemLok Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Nke MemLok Ndị Ọzọ
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
OLILEANYA. Ka anyị leba anya n’Amaokwu Ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ n'ekwu maka olileanya. Chineke chọrọ ka ị nọrọ n'udo, n'atụghị egwu, jupụta n'okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ọ bụghị ya? Ọ gaghị achọ ka ị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ ka iwe ju gị n'obi. Amaokwu gasị n'ekwú maka olileanya dị́ n'ime Akwụkwọ Nsọ na-akụziri gị ka ị ga-esi bụrụ onye ime mgbaghara n'adịghị enye nsogbu. Amamihe na-abịa site na ịtụgharị uche na Okwu Chineke.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele MemLok, Sistemụ Ebe Nchekwa Akwụkwọ Nsọ, maka ịnye nhazi banyere atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ gbasara MemLok, gaa na: http://www.MemLok.com