OKU A NA-AKPỌ ANYỊ Ị LEKWASỊ ANYA N'IHE KACHA MKPAIhe Atụ
Ebube Chineke: Ezi Olile Anya Anyi
Dị ka ndị kwere ekwe, anyị na-abụ ndị a na-ejidekarị n'ime nsogbu nke ndụ kwa ụbọchị. Ọnwụnwa na mkpagbu na-eche anyị ihu, ọ dịkwa mfe ịhapụ ihe dị ezigbo mkpa. Ma na Pọl gwara anyị na olileanya anyị na ọdịnihu anyị adịghị n'ụwa a. Olileanya na ọdịnihu anyị dị n'ime Kraịst.
Mgbe Kraịst ga-apụta ihe, anyị ga-eso ya pụta ìhè n'ebube. Nke a bụ olileanya na ọdịnihu anyị kachasị elu. A ga-agbanwe anyị ka anyị bụrụ oyiyi ya, anyị ga-ekere òkè n'ebube Ya. Nke a bụ nkwa Chineke, ọ bụkwa ihe anyị na-ebi ndụ maka ya.
Iji bie ndụ n'ihe olileanya a, nke mbụ, anyị kwesịrị icheta na Kraịst bụ ndụ anyị. Ọ bụ isi iyi nke ike anyị, nkasi obi anyị, na nduzi anyị. Nke abụọ, anyị kwesịrị ilekwasị anya n'ọdịnihu, kama ị lekwasị n'ugbu a. Anyị kwesịrị ileba anya n'ebube nke ga-abịa. N'ikpeazụ, anyị kwesịrị ibi ndụ n'ụzọ na-asọpụrụ Chineke, ebe anyị maara na a ga-ekpughe ndụ anyị n'ebube ha niile mgbe Kraịst pụtara ihe.
Ka anyị na-ebi na olileanya na atụmanya nke nloghachi Kraịst, anyị ga-amalite inweta mgbanwe na ndụ anyị. Anyị ga-ahụ ọṅụ, udo, na nzube n'ụzọ ndị anyị na-echeghị na ọ ga-ekwe omume.
Ekpere:
Ezigbo Nna nke bi n'eluigwe, nyere m aka idobe anya m n'ebube nke ga-abịa, ma nye m obi ike ibi ndụ na atụmanya nke nloghachi Kraịst. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Nke a bụ oku nye ndị niile kwere ekwe ka ha lekwasị anya na njirimara ọhụrụ bụ nke ha n'ime Kraịst, ma na-echetara ha na a kpọlitewo ha na Kraịst. Ya bụ ihe mere na ha ga eitinye uche ha n'ihe ndị dị n'elu, ọ bụghịkwa n'ihe ndị dị n'ụwa. Atụmatụ ọgụgụ ụbọchị ise a na-arụ ọrụ dị ka oku nye ndị kwere ekwe ka ha bie ndụ okwukwe ha n'ụzọ bara uru, ma na-achọ igosipụta àgwà nke Kraịst n'akụkụ ọ bụla nke ndụ ha.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d