OKU A NA-AKPỌ ANYỊ Ị LEKWASỊ ANYA N'IHE KACHA MKPAIhe Atụ
Nhọrọ Bụ Nke Gị
Ụwa na usoro ya achọtala ụzọ ha ga-esi nọrọ n'ihu ndị bi n'ụwa. Ụwa achọtala ụzọ iji mee ka ị lekwasị anya n'ihe niile dị n'ụwa.
Ọ dị mfe ị bụ onye eijidere n'etiti ihe nkiri nke ndụ kwa ụbọchị, ma Pọl na-asị, "echefukwala ihe dị ezigbo mkpa!"
Pọl na-akpọ anyị ka anyị cheta ihe dị ezigbo mkpa. N'isi njedebe ihe niile, onye ọ bụla kwere ekwe ga-eguzo n'ihu Chineke ma nye nkọwa banyere ihe kachasị nwere oge ha n'oge ha biri n'ụwa.
Onye kwere ekwe ọ bụla ga-emeriri ka anya ha bụrụ ihe e lekwasịrị na ebighi ebi, n'ihi na anyị mara na nsogbu ọ bụla na-eche anyị ihu ebe a n'ụwa bụ ihe dị nwa oge, mana olile anya anyị bụ ihe dị ebighi ebi.
Ya mere, olee otu anyị si eme nke a? Anyị kwesịrị ịhọrọ ihe anyị na-eche n'uche anyị banyere ihe ọ bụla. Anyị nwere ike ịtụgharị uche n'ihe ọjọọ, ma ọ bụ anyị nwere ike ilekwasị anya n'ịdị mma Chineke. Anyị kwesịrị iji Okwu Chineke ahụ mejupụta uche anyị.
Ekpere:
Daalụ Nna maka okwu gị taa, a na m ekpe ekpere ka ị nyere m aka icheta ihe kachasị mkpa mgbe niile ma nyere m aka iji oge m ga-anọ n'ụwa na-eme ihe ndị nwere uru ebighi ebi. Amen
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Nke a bụ oku nye ndị niile kwere ekwe ka ha lekwasị anya na njirimara ọhụrụ bụ nke ha n'ime Kraịst, ma na-echetara ha na a kpọlitewo ha na Kraịst. Ya bụ ihe mere na ha ga eitinye uche ha n'ihe ndị dị n'elu, ọ bụghịkwa n'ihe ndị dị n'ụwa. Atụmatụ ọgụgụ ụbọchị ise a na-arụ ọrụ dị ka oku nye ndị kwere ekwe ka ha bie ndụ okwukwe ha n'ụzọ bara uru, ma na-achọ igosipụta àgwà nke Kraịst n'akụkụ ọ bụla nke ndụ ha.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d