Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Wepụ ihe gbasara gịIhe Atụ

Wepụ ihe gbasara gị

ỤBỌCHỊ 3 NKE 3

Anyị enweghị nchebe

Echiche Ozioma nke 1 Pita 5: 8, Chineke ahapụghị ụmụ ya ka ha bụrụ ndị na-enweghị enyemaka na ndị na-enweghị nchebe, O nyewo anyị ngwá agha nchebe siri ike n'okwu Ya.

Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.

Ekwensu na-achọ, mgbe niile, ụzọ o ga-esi nweta onye kwere ekwe.

Ekwensu na-agba mbọ oge niile, na-achọ otu ọ ga-esi buo agha megide mkpakọrịta anyị bụ ndị kwere ekwe na Chineke nna anyị.

Mana ihe merenụ bụ na, anyị abụghị ndị na-enweghị nchebe. Anyị abụghị ndị arapụworo ka anyị bụrụ ndị eripịara eripịa. Anyị nwere nchebe siri ike n'ime Chineke.

Anyị nwere ike iguzogide ekwensu, ma-anyị yikwasị onwe anyị, ngwa agha niile nke Chineke (Ndị Efesọs 6:11)

Ekpere: Daalụ, Ezi Nna maka na ịghara ịhapụ anyị n'enweghị nchebe. Amen

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Wepụ ihe gbasara gị

Echiche nke Oziọma nke 1 Pita 5. Chineke dịka Nna anyị kpọworo anyị n'ịchịli aka elu, Ọ kpọrọ ụmụ Ya niile ka ha tụkwasị ya ibu ha.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Daniel Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d