Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Wepụ ihe gbasara gịIhe Atụ

Wepụ ihe gbasara gị

ỤBỌCHỊ 2 NKE 3

Ị nọghị sọ gị

Echiche Ozioma nke 1 Pita 5: 9, Chineke dị ka ezigbo nna agaghị ekwe ka a nwaa ụmụ ya ọnwụnwa gabiga ihe ha nwere ike ịnagide.

Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.

Ịmara na ụmụnna gị ndị kwere ekwe n'ụwa nile na-agabiga ọnwụnwa dịgasị iche dị ka gị, ma na-emerikwa ha, ga-agba gị ume iguzo n'okwu Chineke megide nzube ọjọọ nke onye iro.

Ọ bụghị naanị gị. Ọ bụghị naanị gị na-agabiga ọnwụnwa. I bụ otu n'ime nnukwu obodo nke

Ndị kwere na Jizọs Kraịst n'ụwa niile.

Ka nghọta a mee ka anyị dịrị n'otu. Guzosie ike n'okwukwe ma guzogidekwa ekwensu, ebe ị maara na ị ga-enwe mmeri na-ebe ọnwụnwa niile chere gị ihu.

Ekpere: Mgbe ọ bụla ọnwụnwa chere m ihu, Ezi Nna, nyere m aka ka m cheta na ọ bụghị naanị m nọ. Amen

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Wepụ ihe gbasara gị

Echiche nke Oziọma nke 1 Pita 5. Chineke dịka Nna anyị kpọworo anyị n'ịchịli aka elu, Ọ kpọrọ ụmụ Ya niile ka ha tụkwasị ya ibu ha.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Daniel Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d