Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bie Ndụ n’Ike n’Obi Ike!Ihe Atụ

Bie Ndụ n’Ike n’Obi Ike!

ỤBỌCHỊ 5 NKE 8

“Ọ Na-eme Ka Nzọpụta bụrụ Eziokwu Onwe”

Ọ bụ ezie na ọ bụ Jizọs kwụrụ ụgwọ maka nzọpụta anyị, ọ bụ ọnụnọ Chineke site na Mmụọ Nsọ na-eme ka nzọpụta bụrụ eziokwu nye onye ọ bụla ga-anata ya. Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụghị nanị na anyị ga-enweta nzọpụta mgbe a mụrụ anyị. Enwere mmụgharị nke mmụọ nke ga-ewerịrị ọnọdụ, nke naanị Mmụọ Nsọ nwere ike ime.

“Jisus zara, N'ezie, n'ezie, asim i, Ọ buru na amughi madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pughi ibà n'ala-eze Chineke. Nke amuworo site n'anu-aru bu anu-aru; nke amuwo-kwa-ra site na Mọ Nsọ bu mọ.” Jọn 3:5-6

Mgbe ọ bula mmadụ nabatara Kraịst n'ime ndụ ha, ọ na-akpọku nweghari nke ime mmụọ ha nke g'eme ka ewezuga ntaramahụhụ mmehie na ndụ ha.

Na mgbakwunye, Mụọ Nsọ na-arụ ọrụ na ndụ nke ndị na-ekweghị ekwe site na ikpughe ịhụnanya na-enweghị atụ nke Chineke n'ebe ha nọ. Jisus siri,

“Ma mb͕e ọ bula Onye-nkasi-obi ahu gābia, Onye Mu onwem gēsi n'ebe Nnam nọ zitere unu, bú Mọ nke ezi-okwu, Onye si na Nnam puta, Onye ahu gāb͕aram àmà:” Jọn 15:26

Taa, Mmụọ Nsọ na-aga n'ihu n'ozi a magburu onwe ya nke bụ ime ka a mara ịhụnanya Chineke site n'ịkpọsa Jizọs, ịhụnanya nke Chineke n'onwe ya, na ihe niile Ọ na-anọchi anya ya nye ndị kwere ekwe ma ndị na-ekweghị ekwe n'ụwa anyị.

Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Bie Ndụ n’Ike n’Obi Ike!

Ị nọghị naanị gị. Ma ị dị ụbọchị 1 ma ọ bụ afọ 30 n'ime okwukwe Ndị Kraịst, eziokwu a na-eguzosi ike maka ihe niile ndụ nwere ike ịma anyị aka. Mụta ka ị ga-esi nabata enyemaka Chineke nke ọma na atụmatụ a. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig