Ị Nwere Ekpere!Ihe Atụ
![Ị Nwere Ekpere!](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F49800%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
“Igodo Isii maka Ekpere Ahụike na nke Ziri Ezi – Akụkụ nke Abụọ”
4. Gwa Chineke mkpa gị na ihe ị chọrọ, rịọkwa Ya ka O zute ha. “Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta...”
Ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ị nọ dị omimi, ọdịghị agwụ agwụ, na-enweghị atụ, ọmụmatụ nke Akwụkwọ Nsọ tụnyere ya dika ọmịiko nna na-enwe n’ebe nwa ya nọ. Ọ chọrọ ịnụ n'ọnụ nwa Ya (nke bụ gị); Ọ chọrọ ịnụ gbasara ndụ gị, mkpa gị na ọchịchọ gị, ma Ọ chọrọ ka ị bịakwute Ya maka mkpa ndị ahụ. Ịhụnanya ya n’ebe ị nọ na-akpali Ya ịgọzi gị karịa nke ị nwere ike ịtụ anya ya.
5. Rịọ Chineke ka ọ gbaghara gị mmehie gị, na-echeta mkpa ọ dị ịgbaghara ndị ọzọ onwere ike ha emejọọla gị. “Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ.”
Ịrịọ Chineke ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị na-amalite site n’ibu ụzọ kweta mmehie ndị ahụ n’onwe anyị, wee kwupụta ha nye Chineke.
“Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile.” 1 Jọn 1:9
Ị nwere ike ijide aka na Chineke agbagharala gị ma sachapụ gị mmehie gị. Site na mgbaghara ahụ, enwekwara nnwere onwe pụọ na ikpe ọmụma, ihere na amamikpe.
Ma, Chineke na-arịọkwa na dika Ọ gbagharala anyị mehiere anyị otú ahụ ka anyị gbaghara ndị ọzọ bụ ndị meghere anyị. Dị nnọọ ka ịnata mgbaghara sitere n’aka Chineke si eweta nnwere onwe, otú ahụ ka ịgbaghara ndị ọzọ si adịkwa – nnwere onwe pụọ n’obi ilu, iwe na ikwe ka ihe ọjọọ ndị gara aga nọgide na-ewute anyị.
Mgbaghara, ma ịnata ma inye ya, bụ ntọala ibi ndụ nke nnwere onwe n’ime Kraịst.
6. Kpee ekpere maka nduzi Chineke iji nyere aka ịzere ọnwụnwa na ọnọdụ ndị nwere ike ọ gaghị eyi Ya nke ọma. “Edubala anyị n'ọnwụnwa, kama napụta anyị n'aka ajọ onye ahụ."
Chineke agbagharawo mmehie anyị wee sachapụ anyị ajọ omume nile dịka e kwere ná nkwa na 1 Jọn 1:9, ma anyị ka ga-ezute ọnwụnwa, n’ibi n’ụwa a dara ada. Akụkụ a nke Ekpere Onyenwe Anyị na-egosi mkpa ọ dị na ọ bụghị nanị ịdabere na ịnwe afọ ojuju na mgbaghara nke Chineke na-enye anyị, n’ebughị ụzọ cheta mkpa ọ dị izere mmehie n’ọdịnihu. Ọ bụ ezie na Chineke na-ewepụ ntaramahụhụ ime mmụọ nke mmehie site n'ịgbaghara anyị, ọ pụtaghị na ọ na-ewepụ ihe ọjọọ ndị si ná mmehie pụta. N’ihi nke a, ọ dị mkpa ikpe ekpere maka enyemaka Chineke iji zere ọnwụnwa.
Kwa ụbọchị, malite inye Chineke oge ọ bụla i nwere ike iji ọṅụ nye ya n'ekpere. Chineke enweghị oke ị ga-ezute kwa ụbọchị. Ọzọkwa, ọ ga-abụ ihe ịma aka mgbe ụfọdụ ịmụrụ anya ma zere “ihi ura.” Ekwela ka ike gwụ gị; mara na Chineke ga-agọzi gị ka ị na-etinye oge gị iye Ya n'ekpere!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![Ị Nwere Ekpere!](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F49800%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Chọpụta ụkpụrụ eji ewulite ndụ ekpere dị ike ma dị irè. Ekpere – iso Chineke na-akparịta ụka site n’onwe gị – bụ isi ihe na eweta mgbanwe dị mma na ndụ anyị na gburugburu anyị. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig