Ị Nwere Ekpere!Ihe Atụ
![Ị Nwere Ekpere!](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F49800%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
“Ekpere Nke Onwe Onye”
Iso ndị enyi, ezinụlọ ma ọ bụ naanị ikpe ekpere ọnụ tupu iri nri bụ ụzọ pụtara ìhè iji soro Chineke kparịta ụka n'ebe ọha na eze nọ. Ma na mgbakwunye n’isonye n'ekpere ụlọọrụ, Chineke chọrọ ka anyị sonye n'omume ekpere nke onwe karị – nani n’etiti gị na Chineke. Jizọs nwere ihe a ikwu maka ekpere naanị anyị:
“Ma gi onwe-gi, mb͕e ọ bula i nēkpe ekpere, bà n'ime-ulo ntà gi, mb͕e i mechisi-kwa-ra uzọ-gi, kpere Nna-gi Nke di na nzuzo, Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.” Matiu 6:6
Ntụziaka Jizọs nyere anyị maka ikpe ekpere n’ime ụlọ na-egosi na Chineke nwere mmasị na ndụ anyị nke ọma.. Ọchịchọ ya bụ ịkwalite mmekọrịta anyị na Ya site na nkaparịta uka n'otu n'otu. Chineke na-ahụta nkwa naanị gị na Ya inwe mmekọrịta, ma kwe nkwa ịkwụghachi gị ụgwọ ma gọzie gị.
Chineke chọkwara ka anyị bụrụ ndị nwere ezi obi na ndị obi ha ghere oghe na nkparịta uka nke anyị na Ya, dịka anyị si anọnyere onye anyị hụrụ n'anya. Ọ bụ ezie na ibu usoro okwu ekpere n'isi maka okwu bụ omume dị mma, ma nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke chọrọ ka anyị kọsara Ya onwe anyị n'ezie karia ịbụ naanị usoro okwu ndị anyị buburu n'isi. Jizọs nwere ihe a ikwu maka ikwu eziokwu n'ekpere anyị:
“Ma mb͕e unu nēkpe ekpere, unu ekwula okwu-nkwukwasi efù, dika ndi mba ọzọ nēme: n'ihi na ha nēchè na agānu olu-ha n'ọtutu okwu ha nēkwu.” Matiu 6:7-8
Ọ bụ ezie na Chineke amaraworị ihe dị anyị mkpa na ihe anyị chọrọ tupu anyị arịọ ya, Ọ ka na-achọ ka anyị jiri ezi obi na atụmanya na-ekwupụta arịrịọ ndị ahụ nye Ya n’egosi na O bu ọdịmma anyị kacha mma n'uche. Ọ chọrọ iji ịhụnanya na ikwesị ntụkwasị obi za ekpere ọ bụla.
Ihe ọzọ dị mkpa nke ekpere onwe onye bụ nnọgidesi ike na nkwụsi ike. Ike adịghị agwụ Chineke ịnụ arịrịọ anyị, ọ bụrụgodị na ha bụ otu ihe ahụ anyị gwaworo Ya na mbụ. Jizọs nwere ihe a ikwu gbasara ịdị uchu n’ekpere anyị:
“Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu: n'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere.” Matiu 7:7-8
Iwepụta oge kwa ụbọchị maka iso Chineke akparịta uka dị mkpa iji na-eto eto na ije ije anyị dika Ndị Kraịst. Gbalịa ka ịhọrọ oge kwa ụbọchị mgbe ị na-agaghị adọpụ uche, ma echekwala na Chineke nwere nkwụsị na nche Ya n’elele ịhụ oge ole ị na-enye Ya; Ọ naghị. Naanị ihe ọ chọrọ bụ gị. Nzuzo, ezi obi na nnọgidesi ike bụ njirimara atọ dị oke mkpa nke oge ekpere gị na Chineke n'otu n'otu ga-enyere gị aka iwulite mmekọrịta sịrị ike nke gị na Ya. Ị ga ịnụ ụtọ oge a dị oké ọnụ ahịa, na ị gakwa adabere na Ya n'ụzọ ị na-enwetụbeghị mbụ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![Ị Nwere Ekpere!](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F49800%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Chọpụta ụkpụrụ eji ewulite ndụ ekpere dị ike ma dị irè. Ekpere – iso Chineke na-akparịta ụka site n’onwe gị – bụ isi ihe na eweta mgbanwe dị mma na ndụ anyị na gburugburu anyị. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig