Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Etu esi agụ akwụkwọ nsọIhe Atụ

Etu esi agụ akwụkwọ nsọ

ỤBỌCHỊ 2 NKE 3

Nzisa Oziọma; Ụzọ e si ekwusa ozi ọma.

Dị ka akọwarala ihe Akwụkwọ Nsọ bụ̀, na ihe ọ na-egosi na ndụ onye kwere ekwe; ọ bụrụ na ị nọdụrụ ala jụọ ‘Ihe mere’ o ji bụrụ na ị gụọ Akwụkwọ Nsọ, ọ ga-emetụta ‘Etu’ i si agụ Akwụkwọ Nsọ. Baịbụl, ò kwesịrị ịbụ akwụkwọ akụkọ ọzọ? Ọ bụ naanị ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme ọzọ? Mmụọ Nsọ ọ̀ kpaliri ndịikom nsọ nke Chineke naanị ide Akwụkwọ Nsọ okpukperechi ọzọ?

E kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na okwu Chineke dị ọcha, dị ka ọlaọcha anụchara ugboro asaa. Ọ bụ ahụike n’anụarụ nke ndị na-achọta ya. A ga-eburịrị ihe achọ ịmata n’obi wee na-agụ Akwụkwọ Nsọ. Ebumnuche iji ‘Ghọta’ ma ‘Tinye’ ihe aghotatara n’oru. Nke a bụ naanị ụzọ ọ ga-esi baara onye kwere ekwe uru.

Ọ bụrụ na anyị ga-ede ule dị mkpa maọbụ malite ọrụ, ihe ga-adi anyị mkpa bụ ozi ga-abara anyị uru. Ọ bụghị naanị na anyị ga-agụ akwụkwọ nke ọma; anyị ga-achọ ịghọta ma tinye ihe ọmụma anyị chịkọtara n’ọrụ, n’ụzọ ziri ezi. Kaa? Anyị ga na-ele anya ihe ịga nke ọma na mbọ ahụ. Otu a ka ọ ga-esi dị na ndụ onye kwere ekwe.

Ọ bụrụ na mgbanwe na uto bụ ihe anyị na-atụ anya ya ka anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ, ọ ga-aga n’ihu, na-agbanweghị agbanwe, udi mgbanwe à ga-eleba anya maka ndekọ ya.

Ka ị na-agagharị na ihe ịma aka nke ndụ nke chọrọ amamihe Chineke, na ka ị na-achọ imeri ụgbụ ọkụ nke ndị iro, ị ga-eyinyerịrị ihe agha niile nke Chineke nke gụnyere ‘Mma agha nke Mmụọ’ (Okwu Chineke).

Gbaa mbọ hụ na ịgụ okwu nke Chineke bụ ihe i ji kpọrọ mkpa n’ụbọchị gị taa, na ụbọchị ọ bụla ọzọ.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Etu esi agụ akwụkwọ nsọ

Akwụkwọ Nsọ bụ akwụkwọ dị ezigbo mkpa ná mmekọrịta anyị na Chineke. Ọ bụghị naanị ide ihe nkịtị, kama ọ bụ mmụọ sitere n’aka Chineke, banyere etu ndị kwere ekwe kwesịrị isi na-ebi ndụ ha n’ụwa ebe a. Ọ bụkwa akụkọ banyere etú ụfọdụ ndị nna ochie nke okwukwe si nwee ike iso Chineke jee ije mgbe ha nọ n’ụwa. Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị nwee echiche ka anyị ga-esi na-agụ akwụkwọ nsọ a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/