Etu esi agụ akwụkwọ nsọIhe Atụ
Etu Esi Agụ Akwụkwọ Nsọ: Gịnị bụ Akwụkwọ Nsọ?
Olee etú kacha mma anyị a ga-esi akọwa ka e si agụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụrụ na anyị ebughị ụzọ kọwaa ihe Akwụkwọ Nsọ bụ? Akwụkwọ Nsọ bụ Okwu Chineke edere site n’aka ndị nsọ nke Chineke sitere na mmụọ nsọ. Ọ bụ oriọna dịịrị ụkwụ onye kwere ekwe na ìhè nke ụzọ ya. Ọ bụ akwụkwọ ndenye ọgwụ ime mmụọ a kwadebere maka ọrịa ime mmụọ niile. Ọ bụ ndụ nye ndị na-achọta ya, na ahụike nke anụ ahụ ha. Nke a na-egosikwa na onye kwere ekwe na-enweghị akwụkwọ a bụ onye ahụ adịghị mma, na-arịa ọrịa ma kpuo ìsì.
Dị ka e si kọwaa, anyị dị ka ụrọ n’aka Ọkpụite, anyị bụkwa ngwaahịa n’aka Onye nrụpụta. Akwụkwọ Nsọ bụ akwụkwọ ntụziaka nke ndụ ndị kwere ,ekwe site na nhazi izizi nke onye rụpụtara ya mere. Ya mere, akwụkwọ ntuziaka a na-ekpughe uche na atụmatụ Chineke maka ndụ mmadụ, na ntuziaka Ya maka etu mmadụ kwesịrị isi na-akpa àgwà.
Akwụkwọ Nsọ bụ ihe nchebe nke ndị kwere ekwe, nke na-enye ya mmeri n’ebe ndị iro ya nọ. Ọ bụ iwu na-eduzi omume ya. Akwụkwọ Nsọ bụ ntọala iwu nke na-agwa ya ọnọdụ na ikike ya n’ime Jizọs Kraịst site na nkwa ya. Akwụkwọ Nsọ zuru oke n’onwe ya ma bụrụ Eziokwu.
N’ụwa nke a na-agbanwe agbanwe ma na-enwogha kwa mgbe, okwu Chineke guzosiri ike ma bụrụ nke a pụrụ ịdabere na ya. Ụwa nwere ike ịgbanwe, ụwa nwere ike ịgafe, ma okwu Chineke agaghị agabiga.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Akwụkwọ Nsọ bụ akwụkwọ dị ezigbo mkpa ná mmekọrịta anyị na Chineke. Ọ bụghị naanị ide ihe nkịtị, kama ọ bụ mmụọ sitere n’aka Chineke, banyere etu ndị kwere ekwe kwesịrị isi na-ebi ndụ ha n’ụwa ebe a. Ọ bụkwa akụkọ banyere etú ụfọdụ ndị nna ochie nke okwukwe si nwee ike iso Chineke jee ije mgbe ha nọ n’ụwa. Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị nwee echiche ka anyị ga-esi na-agụ akwụkwọ nsọ a.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/