Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Isi n’Ụzọ Oziọma Lenye Anya n’Amara ChinekeIhe Atụ

Isi n’Ụzọ Oziọma Lenye Anya n’Amara Chineke

ỤBỌCHỊ 3 NKE 3

Amara; Amara Mechara ya.

Agbasiwom mgba ọma ahụ, agbasiwom ọsọ ahụ, edebesiwom okwukwe ahụ

Ekwensu anaghị atụ egwu anyị imalite ihe. Ụjọ na-atụ ya bụ anyị imecha ya nke ọma. Ọ hụla ka ndị mmadụ na-amalite ihe, na-emezughi ya. Ọ biela ogologo ndụ wee mara na ihe kacha mkpa bụ etu ị si mechaa ọrụ Chineke nyere gị.

‘Ịmecha ya dị mma karịa ịmalite…’

Okwu Chineke ekwusiwo ike na a ga-azọpụta onye na-atachi obi ruo ọgwụgwụ. Ọ na-ewe naanị amara nke Chineke iji tachie obi ruo n’ọgwụgwụ. Mmehie juru ebe niile, ịhụnanya ọtụtụ mmadụ ajụwo oyi ma site n’amara nke Chineke, anyị ga-emecha nke ọma n’aha Jizọs. Chineke we sị Zerubabel, Ọ bụghị n’ike, ọ bụghị kwa n’uwe, kama ọ bụ Mmụọ nke Chineke. Ọ bụ Mmụọ nke Onyenwe anyị na-enye amara iji mechaa nke ọma. N’amaokwu nke na-eso ya, Ọ dịghị ihe ọbụla, maọbụ ọbụna ugwu dị ike, nke ga-eguzo n’ụzọ Zerubabel; ọ ga-aghọ kwa ebe dị larịị n’iru Ya. Ma mgbe Zerubabel na-edobe nkume IKPEAZU nke ụlọ uku Chineke, ndị Izrel ga-eti mkpu: Amara, amara diri ya. '

Amara malitere ya! Amara ga-emecha ya! Amara! Amara! Alfa (mmalite) na Omega (njedebe) na-ekiri anyị. Ọ nọ na-ekiri tupu a mụọ anyị, ebe ọ bụ na ọ bụ omega, Ọ ga-ahụ na site n’amara ya, anyị ga-emecha ihe niile nke ọma ma tinye nkume ikpeazụ n’ebe o kwesiri ịdị tupu anyị ekubie ume.

‘Ma Chineke sịrị m, “Lee, Jeremaya! Kedu ihe ị na-ahụ? M wee za, si, Ahurum alaka sitere n’osisi almond: Onyenwe anyị wee si, Otú a ka ọ dị, ọ pụtara na m na-ele anya, na M ga-emezu nzubem niile.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Isi n’Ụzọ Oziọma Lenye Anya n’Amara Chineke

Njem Ndị Kraịst bụ nke anyị na-adịghị ahụ Chineke ihu na ihu, anyị na Ya na-akpakọrịta ma na-ekwurịta okwu site n’okwukwe. Naanị ụzọ anyị ga-esi mee ihe na-atọ Chineke ụtọ mgbe anyị na ya na-aga ije bụ site n’ịga ije n’okwukwe, ebe anyị apụghị iji anya nkịtị hụ ya. Anyị na-anụ ya site n’okwukwe, anyị na-agwa ya okwu site n’okwukwe, anyị na-agakwurukwa ya n’ekpere site n’okwukwe.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/