Isi n’Ụzọ Oziọma Lenye Anya n’Amara ChinekeIhe Atụ
Amara; Amara malitere ya.
Ònye ka ị bụ, gị oké ugwu? N’iru Zerubabel ị ga-aghọ ebe dị larịị: ọ ga-eweputa kwa nkume nke elu n’itiri ya oké mkpu, sị, Amara, amara dịrị ya. Zekaraya 4:7 KJV
Anyị na-echekarị ihe mgbochi ihu mgbe anyị na-amalite ihe ọhụrụ. O nwere ike ịbụ ọrụ ọhụrụ, alụmdi na nwunye, mmekọrịta, ọrụ, na ihe ndị ọzọ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ọ bụ, amara Chineke zuru ezu ime ka ugwu ọbụla dị larịị. Ka anyị lee Nehemaya anya. Ozigbo o kpebiri ibili wue mgbidi Jerusalem, Sanbalat, bú onye Horonait, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we bịa n’iru ya. Nsogbu ịdị apụtaghị na amara Chineke adịghị. Kama, ọ bụ oge a ga-enwe ike igosipụta amara karịa.
Nehemaya 4:7–9
[7] O rue na, mgbe Sanbalat na Tobaia na ndị Arebia na ndị Amọn na ndị Ashdod nụrụ na a na-aluzu mgbidi Jerusalem niile, na amalitere ituchi ntipú-ya niile, iwe ha wee di ọkụ nke uku; [8] Ha we kekọta onwe ha, ha niile n'otù, ịbịa ibuso Jerusalem agha, na ịkpatara ya ihe njehie. [9] Anyi wee kpeere Chineke anyị, guzo ndị nche megide ha ehihie na abalị, n'ihi ha. (ESV)
Ka ha lusosịrị ha ọgụ ọtụtụ ogè, Chineke nyere ha amara iji rụchaa ọrụ ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke agaghị enye anyị ihe karịrị ihe anyị ga-emeli maka na amara ya ezuolara anyị. Nke a mere na anyị enweghị ike ịwepu ọrụ ekpere. Anyị ga-anọgide na-ekpe ekpere maka amara nke Chineke n’akụkụ niile nke ndụ anyị. Ka anyị wee jiri obi ike bịaruo ocheeze amara nke Chineke, ka anyị wee nweta ebere ma nweta amara iji nyere anyị aka n’oge anyị nọ na mkpa. N’ihi na amara ya zuru oke ịmalite ọrụ mà rụchaa ya.
Ma amakwaram na Chineke, Onye malitere ezi ọrụ ahụ n’ime unu, ga-aga n’iru n’ọru Ya rue mgbe o mezuru n’ụbọchị ahụ mgbe Kraịst Jizọs ga-alaghachi.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Njem Ndị Kraịst bụ nke anyị na-adịghị ahụ Chineke ihu na ihu, anyị na Ya na-akpakọrịta ma na-ekwurịta okwu site n’okwukwe. Naanị ụzọ anyị ga-esi mee ihe na-atọ Chineke ụtọ mgbe anyị na ya na-aga ije bụ site n’ịga ije n’okwukwe, ebe anyị apụghị iji anya nkịtị hụ ya. Anyị na-anụ ya site n’okwukwe, anyị na-agwa ya okwu site n’okwukwe, anyị na-agakwurukwa ya n’ekpere site n’okwukwe.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/